bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
John 3
John 3
Igbo 2006
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 4 →
1
Ma otù nwoke nime ndi-Farisi di aha-ya bu Nikọdimọs, otù onye-isi nke ndi-Ju:
2
Onye ahu biakutere Ya n'abali, si Ya, Rabai, ayi matara na I bu onye-ozizí Nke siworo n'ebe Chineke nọ bia: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru ime ihe-iriba-ama ndia nke Gi onwe-gi nēme, ma ọ buru na Chineke anọyeghi ya.
3
Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.
4
Nikọdimọs we si ya, Èsi aṅa pu imu madu mb͕e ọ kara nká? ọ̀ puru ibà n'afọ nne-ya nke ub͕ò abua, ewe mua ya?
5
Jisus zara, N'ezie, n'ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n'ala-eze Chineke.
6
Nke amuworo site n'anu-aru bu anu-aru; nke amuwo-kwa-ra site na Mọ Nsọ bu mọ.
7
Ka ọ ghara iju gi anya na M'siri gi, Aghaghi imu unu ọzọ.
8
Ifufe nēfe ebe ọ nāchọ, i nānu kwa olu-ya, ma i mataghi ebe o si bia, na ebe ọ nāga: otú a ka onye ọ bula amuworo site na Mọ Nsọ di.
9
Nikọdimọs zara, si Ya, Ìhe ndia si aṅa pu ime?
10
Jisus zara, si ya, Gì onwe-gi bu onye-ozizí Israel, ma i maghi ihe ndia?
11
N'ezie, n'ezie, asim i, Ayi nēkwu ihe ayi matara, ayi nāb͕a kwa àmà ihe ayi huru; ma unu anaraghi àmà-ayi.
12
Ọ buru na agwaram unu ihe nke uwa, ma unu ekweghi, ùnu gēsi aṅa kwere, ma ọ buru na agwam unu ihe nke elu-igwe?
13
Ọ dighi kwa onye ọ bula rigoworo n'elu-igwe, ma-ọbughi Onye siri n'elu-igwe ridata, bú Nwa nke madu.
14
Ma dika Moses weliri agwọ n'ọhia, ọbuná otú a aghaghi iweli Nwa nke madu elu:
15
ka onye ọ bula nke kwere we nwe ndu ebighi-ebi na Ya.
16
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.
17
N'ihi na Chineke eziteghi Ọkpara-Ya n'uwa ka O kpe uwa ikpé; kama ka ewe site n'aka-Ya zọputa uwa.
18
Ekpeghi onye kwere na Ya ikpé: ekpewo onye nēkweghi na Ya ikpé ub͕u a, n'ihi na o kweghi n'aha nke Ọkpara Chineke muru nání Ya.
19
Ma nka bu ikpé ahu, na Ìhè ahu abiawo n'uwa, ma madu huru ọchichiri n'anya kama Ìhè ahu; n'ihi na ọlu-ha jọrọ njọ.
20
N'ihi na onye ọ bula nke nēme ihe nādighi nma nākpọ Ìhè ahu asì, ọ dighi-abiakute kwa Ìhè ahu, ka aghara itu ya ọlu-ya nile n'anya.
21
Ma onye nēme ihe bu ezi-okwu nābiakute Ìhè ahu, ka ewe me ka ọlu-ya puta ìhè, na aluworo ha na Chineke.
22
Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus na ndi nēso uzọ-Ya biara n'ala Judia; n'ebe ahu ka Ya na ha nānọgide, Ọ nēme kwa baptism.
23
Jọn nēme kwa baptism n'Inon nke di Selem nso, n'ihi na miri riri nne n'ebe ahu: ha we nābia, anēme kwa ha baptism.
24
N'ihi na akātubàghi Jọn n'ulo-nkpọrọ.
25
Ya mere iju-ajuju putara n'etiti ndi nēso uzọ Jọn na onye-Ju banyere ime-ọcha.
26
Ha we biakute Jọn, si ya, Rabai, Onye gi na Ya nọ n'ofè Jọdan, Onye gi onwe-gi b͕aworo àmà nye Ya, le, Onye ahu nēme baptism, madu nile nābiakute kwa Ya.
27
Jọn zara, si, Madu apughi inata ihe ọ bula, ọ buru na eweghi ya nye ya site n'elu-igwe.
28
Unu onwe-unu nāb͕aram àmà, na m'siri, Mu onwem abughi Kraist ahu, kama, na ezitewom n'iru Ya.
29
Onye nwere nwunye ọhu bu onye nālu nwunye ọhu: ma enyì nke onye nālu nwunye ọhu, onye nēguzo nānu kwa okwu-ya, ọ nāṅuri ọṅu nke-uku n'ihi olu onye ahu nālu nwunye ọhu: ya mere emezuwo ọṅùm a.
30
Ya onwe-ya aghaghi idi nāba uba, ma aghaghm idi nāla alà.
31
Onye si n'elu bia ka ihe nile elu: onye si n'ala puta nāputa n'ala, si kwa n'ala nēkwu okwu: Onye si n'elu-igwe bia ka ihe nile elu.
32
Ihe nke ọ huworo na nke Ọ nuru, nka ka Ọ nāb͕a àmà; ma ọ dighi onye ọ bula nānara àmà-Ya.
33
Onye nara àmà-Ya kara akàrà-ya na nka, na Chineke bu Onye ezi-okwu.
34
N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ.
35
Nna nāhu Ọkpara-Ya n'anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n'aka.
36
Onye kwere n'Ọkpara ahu nwere ndu ebighi-ebi; ma onye nēkweyeghi Ọkpara ahu agaghi-ahu ndu, kama iwe Chineke nānọgide n'aru-ya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21