bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Zechariah 1
Zechariah 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 2 →
1
N'ọnwa nke-asatọ, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, ka okwu Jehova ruru Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,
2
Jehova ewesawo nna-unu-hà oké iwe.
3
I gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Laghachikutenum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gālaghachikute kwa unu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.
4
Unu adila ka nna-unu-hà, ndi ndi-amuma mbu kpọrọ òkù, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Biko, sinu n'uzọ ọjọ nile unu, na n'omume ọjọ nile unu, lata: ma ha anughi, ha aṅaghkwam nti; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
5
Nna-unu-hà, òle ebe ha nọ? ndi-amuma kwa, ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ha nādi ndu?
6
Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.
7
N'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iri-na-otù, nke ahu bu ọnwa Shebat, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, okwu Jehova we rue Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,
8
Ahurum n'abali, ma, le otù onye nke nānọkwasi inyinya nācha uhie uhie, onye ahu nēguzo kwa n'etiti osisi myrtle nke di n'ebe miri emi; n'azu ya ka inyinya di iche iche guzoro, nke nācha uhie uhie, na nke nācha dika manu, na nke nācha ọcha.
9
M'we si, Ǹdia bu gini, onye-nwem? Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu sirim, Mu onwem gēme ka i hu ihe ndia bu.
10
Onye ahu nke nēguzo n'etiti osisi myrtle we za, si, Ndia bu ndi Jehova ziteworo ijeghari n'uwa.
11
Ha we za mọ-ozi nke Jehova nke nēguzo n'etiti osisi myrtle, si, Ayi ejeghariwo n'uwa, ma, le, uwa nka nile nànọdu du, di jū.
12
Mọ-ozi nke Jehova we za, si, Jehova nke usu nile ndi-agha, rùe ole mb͕e ka Gi onwe-gi nāgaghi-emere Jerusalem na obodo Juda nile ebere, bú nke I wesaworo oké iwe ọgu arọ atọ na iri ndia?
13
Jehova we za mọ-ozi nke nāgwam okwu okwu ọma di iche iche, bú okwu nkasi-obi.
14
Mọ-ozi nke nāgwam okwu we sim, Kpọsa, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Jerusalem na Zaion oké ekworo.
15
Ọ bu kwa iwe uku ka Mu onwem nēwesa mba nile ndi nọ jū: n'ihi na Mu onwem were iwe nke-ntà, ma ha onwe-ha yere aka ime ha ihe ọjọ.
16
N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Ejiwom obi-ebere nile laghachikute Jerusalem; agēwu ulom nime ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), agēseti kwa eriri-ọtùtù n'elu Jerusalem.
17
Kpọsa ọzọ, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obodom nile gēsite n'ezi ihe b͕asa ọzọ; Jehova gākasi kwa Zaion obi ọzọ, rọputa Jerusalem ọzọ.
18
M'we welie anyam abua, hu, ma le, mpi anọ.
19
M'we si mọ-ozi nke nāgwam okwu, Ìhe ndia bu gini? Ọ we zam, Ndia bu mpi ahu nke sọsaworo Juda na Israel na Jerusalem.
20
Jehova we me ka m'hu ndi-ọ̀kà anọ.
21
M'we si, Gini ka ndia nābia ime? O kwue, si, Ndia bu mpi ndi sọsara Juda, onye ọ bula we ghara iweli isi-ya: ma ndia abiawo ime ka ha ma jijiji, ituda mpi nile nke mba nile, ndi buliri mpi-ha imegide ala Juda isọsa ya.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14