bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Zechariah 14
Zechariah 14
Igbo 2006
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
1
Le, otù ubọchi nābiara Jehova, mb͕e agēkesa ihe-nkwata-gi n'etiti gi.
2
M'gāchikọta kwa mba nile ibuso Jerusalem agha; agēwere kwa obodo a, punara ya ulo-ya nile, merua ndinyom-ya: nkera obodo a gāpu buru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma agaghi-ebipu ndi nka fọduru n'obodo a.
3
Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n'ubọchi O buru agha n'ubọchi ilu-ọ̀gù.
4
Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n'ubọchi ahu n'elu ugwu Olive, nke di n'iru Jerusalem n'Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n'etiti abua ya n'akuku Ọwuwa-anyanwu na n'akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n'akuku Ugwu, nkera-ya n'akuku Ndida.
5
Unu gēsi kwa na ndagwurugwu ugwum nile b͕alaga; n'ihi na ndagwurugwu ugwu ahu gēru Eze: e, unu gāb͕alaga, dika unu siri n'iru ala-ọma-jijiji b͕alaga n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda: Jehova, bú Chinekem, gābia kwa, ndi nsọ nile gēsoro Gi.
6
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ìhè agaghi-adi, ìhè nēnwu enwu gāb͕achi:
7
ma ọ gābu otù ubọchi nke Jehova mara: ọ bughi ehihie, ọ bughi kwa abali: ma o gēru, na ìhè gādi na mb͕e anyasi.
8
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na miri nēnye ndu gēsi na Jerusalem rùputa; nkera-ha gērùga n'oké osimiri Iru-anyanwu, nkera-ha gērùga kwa n'oké osimiri Ọdida-anyanwu: na mb͕e okpom-ọku na na mb͕e oyi ka ọ gadi.
9
Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n'ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù.
10
Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.
11
Agēbi kwa nime ya, nwezuga ka ebibie ya agaghi-adi kwa ọzọ; Jerusalem gēbi kwa na ntukwasi-obi.
12
Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n'otù n'otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n'ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n'oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n'ọnu-ha.
13
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na oké ọb͕ub͕a-aghara nke Jehova gādi n'etiti ha; ha gējide kwa, onye ọ bula o jide ibe-ya aka, aka-ya gēbili kwa imegide aka madu-ibe-ya.
14
Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.
15
Otú a ka ihe-otiti nke inyinya na inyinya mule na camel na inyinya-ibu na anumanu ọ bula nke gādi n'ulo-ikwū ndia gādi, dika ihe-otiti a.
16
Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'etiti mba nile ndi nābia imegide Jerusalem gārigo kwa-arọ ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na ime ememe ulo-ntu.
17
Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n'etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.
18
Ọ buru kwa na ab͕uru Ijipt adighi-arigobata, ọ̀ gaghi-adi n'aru ha, bú ihe-otiti, nke Jehova gēji ti mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu?
19
Nka gābu ahuhu-nmehie nke Ijipt, na ahuhu-nmehie nke mba nile ndi nādighi-arigo ime ememe ulo-ntu.
20
N'ubọchi ahu ka IHE NSỌ JEHOVA NWERE gādi n'elu ataṅu nile nke inyinya; ite nile n'ulo Jehova gādi kwa ka ọkwa-nwusa di n'iru ebe-ichu-àjà.
21
E, ite ọ bula nke di na Jerusalem, ma-ọbu nke di na Juda, gābu ihe nsọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere: ndi nile ndi nāchu àjà gābia kwa chiri ufọdu nime ha, sie ihe nime ha: ọ dighi kwa onye Kenean gādi ọzọ n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha n'ubọchi ahu.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14