bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Zechariah 6
Zechariah 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 7 →
1
M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, ub͕ọ-ala anọ nēsi n'etiti ugwu abua puta; ugwu ahu bu ugwu ọla.
2
N'ub͕ọ-ala mbu ka inyinya nācha uhie uhie di; n'ub͕ọ-ala nke-abua ka inyinya nēji nji di;
3
n'ub͕ọ-ala nke-atọ ka inyinya nācha ọcha di; n'ub͕ọ-ala nke-anọ ka inyinya turu agwa nwe-kwa-ra ume di.
4
M'we za, si mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, Gini bu ndia, onye-nwem?
5
Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua.
6
Ub͕ọ-ala ahu nke inyinya nēji nji di nime ya nāpuru ala Ugwu; nke nācha ọcha puso-kwa-ra ha; nke turu agwa puru-kwa-ra ala Ndida.
7
Inyinya nwere ume pu-kwa-ra, chọ ije ka ha we jegharia n'uwa: o we si, J nu, jegharia n'uwa. Ha we jegharia n'uwa.
8
O we kpọsiem òkù ike gwam okwu, si, Le, Ndi ahu nke nāpu rue ala Ugwu emewo ka Mọm zue ike n'ala Ugwu.
9
Okwu Jehova we ruem nti, si,
10
Nara ihe n'aka ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú n'aka Heldai, na n'aka Tobaija, na n'aka Jedaia; gi onwe-gi bia kwa n'ubọchi ahu, bata n'ulo Josaia nwa Zefanaia, bú nke ha biaruworo site na Babilon;
11
e, nara ọla-ọcha na ọla-edo, kpua okpu-eze, kpube n'isi Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà;
12
gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Le, otù onye nke Ihe-opupú bu aha-ya; ọ bu kwa n'ọnọdu-ya ka ọ gēsi pú, ọ gēwu kwa ulo uku Jehova:
13
ọbuná ya onwe-ya gēwu ulo uku Jehova; ọ bu kwa ya onwe-ya gēburu ebube nile, nọdu nāchi n'oche-eze-ya; otù onye-nchu-àjà gādi kwa n'oche-eze-ya: ndum-ọdu udo gādi kwa n'etiti ha abua.
14
Okpu-eze ahu gādiri Hilem, di-kwa-ra Tobaija, di-kwa-ra Jedaia, di-kwa-ra Hen nwa Zefanaia, ibu ihe-ncheta n'ulo uku Jehova.
15
Ndi nọ n'ebe di anya gābia kwa, wue n'ulo uku Jehova, unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. Ọ gēme kwa, ọ buru na unu ege olu Jehova, bú Chinek-unu, nti nke-ọma.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14