bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Ezekiel 13
Ezekiel 13
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 14 →
1
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2
“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
3
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ.
4
Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe.
5
Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị.
6
Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “ Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha.
7
Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?
8
“ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
9
Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
10
“ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.
11
Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.
12
Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?”
13
“ ‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya.
14
Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
15
Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,
16
bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” ’
17
“Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha
18
sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya?
19
Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha.
20
“ ‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa.
21
Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
22
Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha.
23
Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48