bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Ezekiel 43
Ezekiel 43
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 42
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 44 →
1
Emesịa, ọ kpọbatakwara m nʼọnụ ụzọ mbata nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.
2
Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile.
3
Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.
4
Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.
5
Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke Onyenwe anyị jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ.
6
Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m.
7
Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe nke ocheeze, na ebe nke ọbụ ụkwụ m abụọ ga-anọgide, ebe a ka m ga-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọ Izrel agaghị emerụkwa aha nsọ m ọzọ, ha onwe ha maọbụ ndị eze ha, site nʼikpere arụsị niile ha na ibubata onyinye olili ozu ndị eze ha, mgbe ha nwụrụ anwụ.
8
Mgbe ha wuru mbata ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ mbata ọnụ ụzọ m, tinye ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ ọnụ ụzọ m, ọ bụkwa naanị mgbidi bụ ihe dị nʼetiti mụ na ha. Ha merụrụ aha nsọ m site nʼihe arụ niile ha mere. Ya mere m ji bibie ha nʼiwe m.
9
Ugbu a, ka ha wezuga adịghị ọcha na ife chi ndị ọzọ ha nʼihu m, bupụkwa onyinye olili ozu ndị eze ha nʼebe m nọ, mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ha ruo mgbe ebighị ebi.
10
“Nwa nke mmadụ, kọwaara ụmụ Izrel ụlọnsọ ahụ m ziri gị. Gwa ha ụdịdị ya, na ịpụ iche ya, ka ihere mee ha nʼihi mmehie ha.
11
Ọ bụrụ nʼezie na ihere emee ha nʼihi ihe ha mere, mgbe ahụ, kọwaara ha ihe niile metụtara otu a ga-esi wuo ụlọnsọ a, na ihe gbasara nkwado ya, na ihe gbasara ọnụ ụzọ ọpụpụ na mbata ya niile, ihe metụtara ebumnobi nke owuwu ya niile na usoro na iwu niile banyere ya. Depụta ihe ndị a nʼihu ha, nye ha ka ha lezie anya mezuo ihe niile metụtara usoro a ga-agbaso wuo ya.
12
“Nke a bụ iwu ụlọ banyere nsọ ukwu ahụ. Ebe niile gbara elu ugwu a gburugburu ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ! Nke a bụ iwu ụlọnsọ ahụ.
13
“Nke a bụ ọtụtụ niile gbasara ebe ịchụ aja ya: Ịdị elu nke ala ya bụ iri sentimita ise na atọ; ịgba gburugburu nke ọnụ ya bụ iri sentimita abụọ na atọ; obosara ya dị iri sentimita ise na atọ. Otu a ka ebe ịchụ aja ahụ ga-aha nʼogologo.
14
Site nʼụkwụ ya nke dị nʼala ruo nʼokere ya nke etiti, ọ ga-adị otu mita nʼogologo nakwa nʼuhie; site nʼokere nke nta ruo na nke ukwu ga-adị mita abụọ nʼogologo na ọkara nʼuhie.
15
Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo.
16
Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita isii nʼogologo na mita isii nʼuhie, nwee akụkụ anọ nke ha nʼotu.
17
Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.”
18
Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị a bụ usoro metụtara iwu ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ifesa ọbara nʼelu ebe ịchụ aja mgbe e wusiri ya.
19
Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị Livayị si nʼezinaụlọ Zadọk, bụ ndị na-abịa m nso ife ofufe nʼihu m, otu oke ehi maka aja mmehie, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
20
Unu ga-ewere ụfọdụ nʼọbara ya tee na mpi anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke mbadamba nkume dị nʼelu, na gburugburu ọnụ ọnụ ya, si otu a sachaa ebe ịchụ aja ahụ, kpuchikwaara ya mmehie.
21
Mgbe ahụ, a ga-ewere nwa oke ehi e ji chụọ aja mmehie ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼebe a kwadoro nʼezi ụlọnsọ ukwu ahụ.
22
“Nʼụbọchị nke abụọ, ị ga-eji nwa mkpi na-enweghị ntụpọ chụọ aja mmehie. A ga-eme ka ebe ịchụ aja dị ọcha, dịka e ji oke ehi ahụ mee ka ọ dị ọcha.
23
Mgbe i mechara mmemme nsacha ndị a, werekwa nwa oke ehi ọzọ nke na-enweghị ntụpọ, na nwa ebule site nʼigwe anụ nke na-enweghị ntụpọ chụọ aja.
24
Were ha jee chee nʼihu Onyenwe anyị, ka ndị nchụaja were nnu fesa ha dịka aja nsure ọkụ a chụrụ nye Onyenwe anyị.
25
“Ụbọchị asaa, kwa ụbọchị ka ị ga-ewepụta otu mkpi, na nwa oke ehi, na nwa ebule site nʼigwe anụ ndị ahụ, chụọ aja mmehie. Ha niile ga-abụ ụmụ anụmanụ ndị na-enweghị ntụpọ.
26
Ụbọchị asaa ka ha ga na-achụ aja ikpuchi mmehie nʼihi ebe ịchụ aja, mee ka ọ dị ọcha, site otu a doo ya nsọ.
27
Ụbọchị nke asatọ, na nʼụbọchị ọbụla so ya, ndị nchụaja ga-achụ aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja, chụọkwa aja udo. Mgbe ahụ, aga m anabatakwa unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
← Chapter 42
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 44 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48