bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Ezekiel 34
Ezekiel 34
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 33
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 35 →
1
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2
“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị ọzụzụ atụrụ Izrel niile, buo amụma sị ha, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ahụhụ na-adịrị unu ndị ọzụzụ atụrụ Izrel, ndị na-enyeju naanị onwe ha afọ. Ọ kwesighị ka onye ọzụzụ atụrụ lekọtazie igwe atụrụ e tinyere nʼaka ya anya?
3
Unu na-eri abụba ha niile, unu na-eyi uwe ajị anụ, na-egbu anụ ndị mara abụba nʼagbanyeghị na unu adịghị elekọta igwe ewu na atụrụ m ndị a.
4
Unu anaghị eme ka ndị na-adịghị ike dị ike, maọbụ gwọọ ndị na-arịa ọrịa, maọbụ kechie ọnya ndị merụrụ ahụ. Unu adịghị akpọghachite ndị kpafuru akpafu, maọbụ pụọ ịchọ ndị furu efu. Kama naanị aka ike ka unu ji na-achị ha.
5
Nʼihi ya, ha agbasasịala nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ anọghị ya. Ha aghọkwaarala anụ ọhịa niile ihe oriri.
6
Igwe ewu na atụrụ nke m na-awagharị nʼugwu niile, na nʼelu ugwu nta niile. Ọ bụkwa nʼelu ụwa niile ka ha gbasara. Ọ dịkwaghị onye na-ajụ ajụjụ banyere ha. Ọ dịkwaghị onye na-elenye anya nʼebe ha nọ.
7
“ ‘Nʼihi nke a, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:
8
Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe unu hapụrụ igwe atụrụ m na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, mee ka ha ghọọrọ anụ ọhịa ihe oriri, ebe unu na-achọgharịghị ha, kama unu nọ na-enyeju onwe unu afọ, ma hapụ igwe atụrụ m ka agụụ gbuo ha,
9
nʼihi ya, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị:
10
Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ana m edo onwe m megide ndị ọzụzụ atụrụ niile. Ọ bụkwa nʼaka ha ka m ga-ajụta ihe banyere igwe ewu na atụrụ m. Aga m eme ka ha kwụsị ị bụ ndị na-azụ igwe ewu na atụrụ m, ka ndị ọzụzụ atụrụ ndị a ghara ịzụ onwe ha nri ọzọ. Aga m esite nʼọnụ ha napụta igwe ewu na atụrụ m, ha agaghị abụkwara ha nri ọzọ.
11
“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha.
12
Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ.
13
Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma.
14
Aga m azụ ha nʼebe ịta ahịhịa mara mma, na nʼelu ugwu niile nke Izrel. Nʼebe ahụ ka ha ga-amakpukwa nʼudo. Ha ga-ata nri nʼebe ịta ahịhịa mara mma nke elu ugwu Izrel.
15
Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile. Aga m eme ka ha makpuru nʼudo, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
16
Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha.
17
“ ‘Ma unu onwe unu, ụmụ igwe anụ ụlọ m, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m ekpe ikpe nʼetiti atụrụ na atụrụ, ebule na mkpi.
18
Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-ata nri kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ zọtọsịa nke fọdụrụ? Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-aṅụ mmiri nke kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ unu na-agbarụ nke fọdụrụ?
19
Ọ bụ ihe kwesiri ekwesi na igwe atụrụ m ga-ata nri unu zọtọrọ azọtọ, ma ṅụọkwa mmiri unu gbarụrụ agbarụ?
20
“ ‘Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ha, nʼezie, mụ onwe m ga-ekpe ikpe nʼetiti atụrụ ndị gbara abụba, na atụrụ ndị a tara ahụ.
21
Nʼihi na unu ji akụkụ ahụ unu, na ubu aka unu na-enupu ha. Unu jikwa mpi unu na-enupu ndị na-adịghị ike, tutu ruo mgbe unu chụsachara ha.
22
Lee, aga m azọpụta igwe ewu na atụrụ m. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. Ha agaghị aghọkwa ihe oriri ọzọ. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya.
23
Aga m edobe otu onye ọzụzụ atụrụ nke ga-elekọta ndị m, ọ bụladị ohu m Devid. Ya onwe ya ga-elekọta ha, bụrụkwa onye ọzụzụ atụrụ nye ha.
24
Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-abụ Chineke ha, ma ohu m Devid ga-abụ onyeisi nʼetiti ndị m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
25
“ ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu.
26
Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri.
27
Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha.
28
Ha agaghị abụkwa mba ndị ọzọ na-apụnara ihe ha nwere, maọbụ ndị anụ ọhịa ga-adọgbu. Ha ga-ebi na-atụghị ụjọ, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.
29
Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche.
30
Ha ga-amata na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke ha, na m na-anọnyere ha, na ha onwe ha kwa, bụ ụlọ Izrel, bụ ndị m, otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwupụtara.
31
Unu bụ igwe ewu na atụrụ m, atụrụ nke ebe ịta nri m, mụ onwe m bụkwa Chineke unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
← Chapter 33
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 35 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48