bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Hosea 1
Hosea 1
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 2 →
1
Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Hosiya nwa Beiri nʼoge Uzaya, na Jotam, na Ehaz, na Hezekaya, bụ ndị eze Juda, na nʼoge Jeroboam nwa Jehoash bụ eze nʼIzrel.
2
Na mmalite okwu Onyenwe anyị site nʼọnụ Hosiya, Onyenwe anyị gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ Onyenwe anyị.”
3
Ya mere, ọ gara lụọ Goma nwa Diblaim, onye tụụrụ ime mụọra ya nwa nwoke.
4
Onyenwe anyị gwara ya, “Aha ị ga-agụ nwantakịrị ahụ bụ Jezril. Nʼihi na tupu nwa oge nta agafee, aga m ata ezinaụlọ Jehu ahụhụ nʼihi ọbara ọ wụsiri na Jezril. Aga m eme ka alaeze nke ụlọ Izrel kwụsị.
5
Nʼụbọchị ahụ, aga m agbaji ụta Izrel na Ndagwurugwu Jezril.”
6
Emesịa, Goma tụụrụ ime ọzọ, mụta nwa nwanyị. Ọ gwara ya, “Aha ị ga-agụ ya bụ Lo-Ruhama, nʼihi na agaghị m enwekwa obi ebere ọzọ nʼahụ ụlọ Izrel, ịgbaghara ha mmehie ha.
7
Ma aga m enwe obi ebere nʼahụ ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-azọpụta ha site na Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Agaghị m eji ngwa agha ọbụla, dịka ụta maọbụ mma agha maọbụ ike ibu agha maọbụ ịnyịnya maọbụ ndị na-agba ịnyịnya zọpụta ha.”
8
Mgbe ọ jụrụ Lo-Ruhama ara, ọ tụụrụ ime ọzọ, mụọ nwa nwoke.
9
Onyenwe anyị sịrị, “Kpọọ aha ya Lo-ammi, nke pụtara unu abụghị ndị m, nʼihi na unu abụghị ndị nke m, mụ onwe m abụkwaghị Chineke unu.
10
“Ma ọnụọgụgụ ụmụ Izrel ga-adị ka aja dị nʼọnụ oke osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ tụọ nʼihe ọtụtụ. Nʼebe ahụ a nọ sị ha, ‘Unu abụghị ndị m,’ nʼebe ahụ ka a ga-anọ sịkwa ha, ‘Ụmụ Chineke dị ndụ ka unu bụ.’
11
A ga-achịkọtakwa ndị Juda na ndị Izrel ọnụ. Ha ga-ahọpụtakwara onwe ha otu onyeisi, si nʼala ahụ rigopụta, nʼihi ihe ukwu ka ụbọchị Jezril ga-abụ.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14