bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Hosea 6
Hosea 6
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 7 →
1
“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị. Ya onwe ya adọkaala anyị, ọ ga-agwọkwa anyị; o tipụla anyị ọnya, ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.
2
Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.
3
Ka anyị mara Onyenwe anyị; ka anyị gbalịsie ike ịmata ya. Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite, nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ, ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”
4
“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda? Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ, dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.
5
Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.
6
Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja, ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.
7
Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m; nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
8
Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe, nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.
9
Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe, otu a ka ndị nchụaja si egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem, leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.
10
Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel. Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna, emerụọkwala Izrel.
11
“Ma nye gị onwe gị, Juda, owuwe ihe ubi nọ na-eche gị. “Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14