bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Hosea 4
Hosea 4
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 5 →
1
Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.
2
Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ, ịgha ụgha na igbu mmadụ, izu ohi na ịkwa iko. Ọgbaaghara dị nʼebe niile, ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka.
3
Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.
4
“Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. Nʼihi na ndị gị dịka ndị na-eseso onye nchụaja okwu.
5
Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi
6
ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. “Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ.
7
Ka ha na-abawanye nʼọnụọgụgụ, otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.
8
Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu.
9
Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile.
10
“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee
11
nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.
12
Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha.
13
Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.
14
“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, mgbe ha na-agba akwụna, maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ mgbe ha na-akwa iko, nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi.
15
“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’
16
Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
17
Ifrem na arụsị agbaala ndụ hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya.
18
Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
19
Ifufe ga-ebupụ ha, aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14