bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Isaiah 17
Isaiah 17
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 18 →
1
Nke a bụ amụma megide Damaskọs, isi obodo Siria. “Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ, kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda.
2
Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea, ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ.
3
Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa, ya na ike alaeze nke sị Damaskọs, ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka ebube nke ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
4
“Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala. Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.
5
Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ, na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka nʼime Ndagwurugwu Refaim.
6
Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa, dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv, hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu, maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.” Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.
7
Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha, nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ.
8
Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka. Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee. Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera, maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.
9
Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.
10
Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị. I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị. Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ, maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,
11
ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala, ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị, nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.
12
Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme, nke yiri mkpọtụ oke osimiri. Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche; ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.
13
Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri, ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ. A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka, na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.
14
Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị, tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa. Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike. E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50
51
52
53
54
55
56
57
58
59
60
61
62
63
64
65
66