bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Isaiah 19
Isaiah 19
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 20 →
1
Nke a bụ amụma megide Ijipt: Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt, ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ. Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya. Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
2
“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha. Nwanne ga-emegide nwanne ya, onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya; obodo ga-emegide isi obodo; otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.
3
Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.
4
Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị, Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri, nke na-adịghị eme ebere, ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.”
5
Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa.
6
Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị ga-atalata bido nʼisi isi. Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.
7
Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ, ifufe ga-efesakwa ha. Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi, ihe niile ga-anwụ.
8
Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa, na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl, ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri ga-ata ahụ.
9
Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
10
Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
11
Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ, ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye. Ị ga-esi aṅaa gwa Fero, “Abụ m otu nʼime ndị maara ihe, onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
12
Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt.
13
Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu, ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie; ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile eduhiela ndị Ijipt ụzọ.
14
Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke; nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
15
Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime, isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.
16
Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
17
Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
18
Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.
19
Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.
20
Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
21
Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.
22
Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
23
Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.
24
Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa.
25
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 20 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50
51
52
53
54
55
56
57
58
59
60
61
62
63
64
65
66