bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Isaiah 42
Isaiah 42
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 41
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 43 →
1
“Lee ohu m, onye m na-agba ume, onye m họpụtara, onye ihe ya na-atọ mkpụrụobi m ụtọ. Aga m eme ka Mmụọ m dịrị nʼime ya. Ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.
2
Ọ gaghị eti mkpu maọbụ welie olu ya kwaa akwa, maọbụ welie olu ya elu, ọ gaghị eme ka a nụ olu ya nʼezi.
3
Ọ gaghị agbaji ahịhịa riidi azọpịara azọpịa, maọbụ menyụọ ogho oriọna na-enwu ntakịrị ntakịrị. Ọ ga-esite nʼikwesị ntụkwasị obi wepụta ikpe ziri ezi.
4
Ọ gaghị asọ ngọngọ maọbụ daa mba, ruo mgbe o hiwere ikpe ziri ezi nʼelu ụwa. Ọ bụkwa nʼozizi ya ka agwa etiti niile ga-atụkwasị olileanya ha.”
5
Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.
6
“Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, akpọla gị ka i gosi ezi omume m. Aga m echebe gị, gbaa gị ume, nʼihi na eweere m gị nye ndị m ka ị bụrụ ihe imesi ọgbụgba ndụ m ike. Ị ga-abụkwa ìhè nye mba niile.
7
Ị ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, gbapụtakwa ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ gbara ọchịchịrị nwere onwe ha.
8
“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị! Nke a bụkwa aha m. Agaghị m enye onye ọzọ ugwu na nsọpụrụ m. Mụ na arụsị a pịrị apị agakwaghị azọ otuto m.
9
Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.”
10
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ; tookwanụ ya, unu ndị niile bi na nsọtụ niile nke ụwa, unu ndị na-arịda nʼosimiri, na ihe niile bi nʼime ya. Toonu ya unu ndị bi nʼala ebe mmiri gbara gburugburu.
11
Ka ọzara na obodo niile dị nʼime ya welie olu ha elu, ka ndị bi na Keda ṅụrịa ọṅụ. Ka ndị bi na Sela tie mkpu ọṅụ, ka ha si nʼelu ugwu niile tisie mkpu ọṅụ ike.
12
Ka ha nye Onyenwe anyị ebube, kpọsaakwa otuto ya nʼala niile mmiri gbara gburugburu.
13
Onyenwe anyị ga-apụta buo agha dịka dike. Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke onye agha ka ọ ga-eji buo agha. Ọ ga-eti mkpu agha megide ndị iro ya, ma merie ha.
14
“Ọ dịla anya kemgbe m gbara nkịtị; ejidesịrị m onwe m aka ike. Ma ugbu a, aga m egosi iwe m; aga m asụ ude, kwaa akwa dị ka nwanyị ime na-eme.
15
Aga m eme ka ugwu ukwu na ugwu nta niile dị larịị, meekwa ka ihe ọkụkụ ha niile kpọnwụọ. Aga m eme ka osimiri ghọọ ọzara, meekwa ka ọdọ mmiri niile takpọọ.
16
Aga m edu ndị kpuru ìsì, site nʼụzọ nke ha na-amaghị, nʼokporoụzọ ha agatụbeghị ka m ga-edu ha; Aga m eme ka ọchịchịrị ghọọ ìhè nʼihu ha, meekwa ka ebe niile gbagọrọ agbagọ guzozie. Ihe ndị a niile ka m ga-eme. Agaghị m agbakụta ha azụ.
17
Ma ndị niile na-atụkwasị arụsị obi, ndị na-asị ihe ndị ahụ a pịrị apị, ‘Unu bụ chi anyị,’ a ga-achụghachi ha azụ nʼọnọdụ ihere.
18
“Geenụ ntị, unu ndị ntị chiri, leenụ anya unu ndị ìsì kpuru, ma hụ ụzọ.
19
Olee onye kpuru ìsì dịka ohu m? Onye kwa ka ntị chiri dịka onyeozi nke eziokwu m? Ọ dị onye ọzọ kpuru ìsì dịka onye a m họpụtara ka ọ bụrụ ohu Onyenwe anyị?
20
Ị hụla ọtụtụ ihe, ma ị dịghị atụkwasị uche gị na ha. Ntị gị ghere oghe, ma ị dịghị eji ya anụ ihe.”
21
Onyenwe anyị emeela ka iwu ya dị ukwuu, meekwa ka ọ dị ebube, nʼihi na ọ tọrọ ya ụtọ isite na ya mee ka ezi omume ya pụta ìhè.
22
Ma e meela ka ndị ya bụrụ ndị e zukpọrọ ihe ha nwere nʼoge agha. A kpọchikwara ha nʼolulu e gwuru nʼala, zoo ha nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ha aghọọla ihe a kwatara nʼagha, ma ọ dịghị onye na-anapụta ha. Ha aghọkwaala ihe e si nʼaka mmadụ pụnara ya nʼike, ma ọ dịghị onye na-asị ndị iro ha, “Nyeghachikwa m ihe m i ji aka ike were.”
23
Onye ka ọ bụ nʼetiti unu nke ga-ege ntị nʼihe ndị a? Onye ga-aṅa ntị si otu a mata ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu?
24
Onye weere Jekọb nyefee nʼaka ndị na-ebibi ihe, onye were Izrel nyefee ndị ohi? Ọ bụ na ọ bụghị Onyenwe anyị onye ha mehiere megide? Nʼihi na ha ekweghị eso ụzọ ya niile, ha erubeghị isi nye iwu ya.
25
Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị ndị ya iwe ọkụ ya, ihe ike nke agha. Ọ bụ ezie na iwe ya bịakwasịrị ha dịka ọkụ na-erepịa erepịa, ma ha aghọtaghị ihe kpatara ya; o repịara ha, ma ha atụgharịa uche ha banyere ya.
← Chapter 41
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 49
Chapter 50
Chapter 51
Chapter 52
Chapter 53
Chapter 54
Chapter 55
Chapter 56
Chapter 57
Chapter 58
Chapter 59
Chapter 60
Chapter 61
Chapter 62
Chapter 63
Chapter 64
Chapter 65
Chapter 66
Chapter 43 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48
49
50
51
52
53
54
55
56
57
58
59
60
61
62
63
64
65
66