bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Job 3
Job 3
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 4 →
1
Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.
2
Job sịrị:
3
“Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’
4
Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị: ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya; ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya.
5
Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.
6
Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
7
Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu, ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.
8
Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ, bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.
9
Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị, ka o lee anya ìhè na-efu, ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ,
10
nʼihi na o mechighị akpanwa nne m, i zonarịkwa anya m nsogbu.
11
“Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m, kubie ume mgbe m si nʼime akpanwa pụta?
12
Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m? Gịnị mere ara ji dịrị i ji zụọ m?
13
Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo; agaara m anọ nʼụra na izuike,
14
mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa, ndị rụkwaara onwe ha ebe obibi dị iche iche nke tọgbọọrọ nʼefu ugbu a,
15
mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo, ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha.
16
Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo, dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya?
17
Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara, nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
18
Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha, ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha.
19
Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
20
“Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè? Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu?
21
Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa, ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
22
ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
23
Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ; bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo, onye Chineke mechibidoro ụzọ?
24
Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị; ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri.
25
Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m, ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m.
26
Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ, enweghị m izuike, naanị ọgbaaghara.”
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42