bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Job 7
Job 7
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 8 →
1
“Ndụ mmadụ nʼụwa ọ bụghị ọgụ na mgba? Ụbọchị ya ọ dịghị ka ụbọchị onye e goro ọrụ?
2
Dịka ọhụ na-eche mgbe anyanwụ ga-ada, maọbụ dịka onye e goro ọrụ si ele anya ụgwọ ọrụ ya,
3
otu a ka e si kenye m ọtụtụ ọnwa nke obi ụtọ na-adịghị nʼime ya, nakwa abalị nhụju anya dị nʼime ya.
4
Mgbe m na-edina ala, ana m asị, ‘Olee mgbe m ga-ebili?’ Abalị na-eseti onwe ya, nʼihi ya, m na-anọ na-atụgharị onwe m tutu chi abọọ.
5
Lee na anụ ahụ m jupụtara nʼikpuru, na akpụkpọ; anụ ahụ m etiwasịala jupụta nʼọnya.
6
“Ụbọchị nke ndụ m na-agabiga ngwangwa karịa ihe eji akpa akwa nke ọkpa akwa, ha na-agwụcha na-enweghị olileanya ọbụla.
7
O Chineke cheta na ndụ m bụ naanị otu nkuume; anya m abụọ agaghị ahụkwa ọṅụ ọzọ.
8
Anya na-ahụ m ugbu a agaghị ahụkwa m ọzọ; unu ga-achọ m ma unu agaghị a hụ m ọzọ.
9
Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa.
10
E, ọ naghị alọghachikwa nʼụlọ ya ọzọ; ebe ya agaghị amakwa ya ọzọ.
11
“Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi.
12
A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche?
13
Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m,
14
nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji,
15
ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a.
16
Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
17
“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,
18
i ji na-enyocha ya ụtụtụ niile, ma na-anwale ya mgbe mgbe?
19
Ị gaghị elepụ anya gị site nʼebe m nọ, maọbụ hapụ m ka m nọọrọ onwe m loda asụ mmiri?
20
Ọ bụrụ na m emehiela, gịnị ka m mere megide gị, gị onye na-ahụ ihe niile anyị na-eme? Gịnị mere i ji elekwasị m anya? Abụrụla m ibu arọ nye gị?
21
Ọ bụ na i nweghị ike ịgbaghara m njehie m, ma bupụ mmehie m? Nʼihi na oge ọnwụ m eruola nso, e, oge a ga-eliba m nʼaja, ma m nwụọ. Mgbe ahụ ị ga-achọ m, ma ị gaghị ahụkwa m anya ọzọ, nʼihi na agaghị m adịkwa.”
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42