bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Job 31
Job 31
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 30
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 32 →
1
“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.
2
Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?
3
Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume, nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?
4
Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?
5
“Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,
6
ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.
7
Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,
8
ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi, ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.
9
“Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ, maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,
10
mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.
11
Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere, bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.
12
Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi; nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.
13
“Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi mgbe ha nwere mkpesa megide m,
14
gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m? Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?
15
Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?
16
“Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa, ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,
17
ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei;
18
ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.
19
Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,
20
ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.
21
Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,
22
mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.
23
Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke, nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.
24
“Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo, maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’
25
Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m, ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,
26
ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya, maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,
27
nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo, maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,
28
mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.
29
“Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,
30
ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.
31
Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’
32
Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama, nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.
33
Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ, site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,
34
nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.
35
(“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.
36
Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m, aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.
37
Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile, aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)
38
“Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m, ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,
39
ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ, maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,
40
ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti, ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.” Okwu Job agwụla.
← Chapter 30
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 32 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42