bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Song of Solomon 1
Song of Solomon 1
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 2 →
1
Abụ nke abụ nke Solomọn.
2
Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ, nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
3
Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma, aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta, ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
4
Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
5
Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
6
Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. Ọ bụ anwụ gbajiri m. Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
7
Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
8
Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
9
Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
10
Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
11
Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
12
Mgbe eze nọ na tebul ya, mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
13
Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpa nke dị nʼetiti ara m abụọ.
14
Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.
15
Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. Leenụ ka ị si maa mma! Anya gị dịka nduru.
16
Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke. E, ị mara mma. Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
17
Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8