bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Song of Solomon 3
Song of Solomon 3
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 4 →
1
Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.
2
Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.
3
Ndị nche na-eche obodo hụrụ m, mgbe ha na-agagharị nʼobodo, ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”
4
Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, achọtara m onye m hụrụ nʼanya, ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka tutu m duta ya nʼụlọ nne m, nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.
5
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta ruo mgbe o masịrị ya.
6
Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa dịka anwụrụ ọkụ, nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, ụda nke ndị ahịa na-ere?
7
Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. Iri mmadụ isii ndị ọka agha, ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.
8
Ha niile ji mma agha; ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, ịdị njikere maka ihe egwu abalị.
9
Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.
10
Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; ala ya bụkwa ọlaedo. Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. Ndị inyom Jerusalem,
11
pụtanụ, bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn, bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze; lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8