bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
/
Song of Solomon 6
Song of Solomon 6
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 7 →
1
Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? Olee ụzọ o sitere? Ka anyị soro gị chọọ ya.
2
Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili.
3
Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.
4
Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ. Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.
5
Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
6
Eze gị dị ka igwe atụrụ nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.
7
Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ.
8
E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,
9
ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. Naanị otu nwanyị nne ya nwere, ọ masịrị onye mụrụ ya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.
10
Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ, nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ, dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?
11
Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi, ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu, ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị, na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.
12
Tupu m mata ebe m nọ, agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.
13
Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ; laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya. Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8