bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Peter 1
1 Peter 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 2 →
1
Ọ bụ mụ onwe m Pita, onyeozi Jisọs Kraịst na-edegara ndị nile Chineke họpụtara akwụkwọ a, ndị ahụ nile si Jerusalem gbara ọsọ ndụ gaa biri nꞌobodo nile nke Pọntus, Galetia, Kapadosia, Esia na Bitinia.
2
Ndị enyi m, nꞌoge gara aga, Chineke onye bụ Nna họpụtara unu dị ka nzube ya si dị. Ọ makwaara na unu ga-emesị bụrụ ụmụ ya. Mmụọ Nsọ ya emeekwala ka unu bụrụ ndị dị nsọ, ndị a sachara nꞌọbara Jisọs Kraịst, na ndị na-erubere ya isi. Ka amara na udo dịrị unu.
3
Ka otuto na nsọpụrụ nile dịrị Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌobi ebere ya nke o nwere nꞌebe anyị nọ ka o ji nye anyị ndụ ọhụrụ ahụ mere ka a kpọbata anyị nꞌezinụlọ ya. Ugbu a anyị nwere olileanya iketa ndụ ebighị ebi nꞌihi na Kraịst esitela nꞌọnwụ bilie.
4
Chineke akwadobela onyinye ndụ ebighị ebi ọ ga-enye ụmụ ya nile. Onyinye a dị nꞌeluigwe ebe Chineke na-echebe ya. Nꞌebe ahụ ọ gaghị emebi emebi, ọ gakwaghị agbanwe ọdịdị ya ma ọ bụkwanụ ree ure.
5
Ihe ndị a nile ga-abụ nke unu nꞌihi na Chineke ji ike ya na-eche unu nche nꞌihi na unu tụkwasịrị ya obi. Chineke ga-enye unu ya nꞌụbọchị ọgwụgwụ oge ahụ nꞌụzọ ọ ga-apụta ìhè nye mmadụ nile.
6
Ya mere, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nꞌihi na ụbọchị ga-ewetara unu oke ọṅụ na-abịa. Ọ bụ ezie na unu nọ nꞌọnọdụ mwute ugbu a nꞌihi ọtụtụ mkpagbu na ọnwụnwa na-abịakwasị unu, ma ihe ndị a nile na-adị nanị nwa oge.
7
Ọnwụnwa na mkpagbu ndị a na-enyere unu aka ịnwapụta ma okwukwe unu nwere o sikwara ike. A na-anwa okwukwe unu dị ka a ga-asị na ọ bụ ọlaedo e ji ọkụ na-anwapụta. Ọ bụ ezie na ọlaedo bụ ihe pụrụ imebi emebi, ma a ga-eji ọkụ nwaa ya, ịmata nke bụ ezi ọlaedo, na nke na-abụghị ya. Ya mere, ebe ọ bụ na okwukwe unu dị oke ọnụ ahia karịa ọlaedo, a ga-anwakwa unu ịhụ ma ọ ga-eguzosikwa ike. Ọ bụrụ na okwukwe unu eguzo chịm nꞌọnọdụ ọnwụnwa ndị a nile, iguzosi ike unu ga-ewetara unu otuto, ebube na nsọpụrụ nꞌụbọchị ahụ Jisọs ga-alọghachi.
8
Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ Kraịst mgbe ọ bụla, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu hụrụ ya nꞌanya. Nꞌezie, ọ bụladị ugbu a unu nwere obi nke jupụtara nꞌụdị ọṅụ ahụ ọnụ na-apụghị ịkọwa.
9
Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nꞌihi ntụkwasị obi unu nꞌime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụ obi unu.
10
Nzọpụta a bụ ihe ndị amụma na-aghọtaghị nke ọma. Ha dere ọtụtụ ihe banyere ya, jụọkwa ọtụtụ ajụjụ banyere ihe nzọpụta ahụ pụtara.
11
Ha gbalịsịrị ike ịchọpụta ihe Mmụọ Kraịst ahụ bi nꞌime ha na-ekwu, mgbe ọ na-agwa ha okwu. Nꞌihi na okwu ahụ nile Mmụọ Kraịst gwara ha bụ ihe mezuru na ndụ Kraịst. O mezuru nꞌahụhụ ya nile na ebube nile ga-eso ahụhụ a. Ma nꞌoge ahụ ha aghọtaghị mgbe ihe ahụ ha na-ebu amụma banyere Kraịst ga-emezu. Ha amakwaghị nꞌoge ahụ onye ọ ga-emezu nꞌahụ ya.
12
Ma Chineke mere ka ndị amụma mata na ọrụ ha rụrụ abụghị maka ọdịmma nke aka ha, kama ọ bụ nꞌihi ọdịmma nke ndị ga-ebi nꞌoge dị nꞌihu, bụ unu onwe unu. Ugbu a kwa a na-ekwusara mmadụ nile ozi ọma a. A na-ekwusakwa ya site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ kwuru ha. Ee, a na-ekwusa ozi ọma a nke na-agụ ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe agụụ ịnụ ihe banyere ya.
13
Nꞌihi ya, kwadoonụ obi unu, nọọkwanụ na njikere dị ka ndị maara ihe ha na-eme. Tụkwasịkwanụ olileanya unu na ngọzi ahụ Chineke ga-enye unu, mgbe a ga-eme ka Jisọs Kraịst bịa ọzọ.
14
Na-eruberenụ Chineke isi. Unu ekwela ka ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ unu agụụ mgbe unu nọ nꞌọchịchịrị, na-achị ndụ unu.
15
Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nꞌihe nile unu na-eme, dị ka Chineke, onye kpọrọ unu si dị nsọ.
16
Nꞌihi na Chineke ekwuola na “Unu aghaghị ịdị nsọ.”
17
Matanụ nke ọma na Chineke, onye ahụ unu na-akpọku nꞌekpere, adịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-ekpe mmadụ ikpe. Ọ na-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị, nꞌihi ya, jiri itu egwu Chineke bie ndụ gị nꞌụwa.
18
Nꞌihi na Chineke ji ihe na-apụghị imebi emebi, ihe dị oke ọnụ ahia karịa ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site na ndụ ọjọọ ahụ unu ketara site nꞌaka nna nna unu ha.
19
Ọ bụ ọbara dị oke ọnụ ahia nke Kraịst wụsịrị ka e ji gbapụta unu; ọbara Kraịst ahụ, onye na-emeghị mmehie, na onye dị ka nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọ bụla.
20
Chineke ahọpụtalarị Kraịst tupuu e kee ụwa. Kama ọ bụ nꞌọgwụgwụ oge ndị a ka Chineke mere ka ọ pụta ìhè iwetara unu ngọzi.
21
Ọ bụkwa site nꞌaka ya ka unu ji tụkwasị Chineke obi, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, tụkwasịnụ okwukwe unu na olileanya unu na Chineke.
22
Ugbu a, ebe unu sitere nꞌirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya, werenụ obi unu nile hụ onwe unu nꞌanya.
23
Nꞌihi na unu enweela ndụ ọhụrụ ugbu a. Ọ bụghị ndụ unu ketara site nꞌọmụmụ nke nne na nna unu, nꞌihi na ụdị ndụ na-esite nꞌọmụmụ ahụ na-emesi gabiga. Ma ndụ ọhụrụ unu nwere ga-adị ruo mgbe ebighị ebi nꞌihi na o si nꞌaka Kraịst bụrụ nke unu, ee, nꞌaka Kraịst, onye bụ okwu ahụ dị ndụ Chineke na-ekwu nye ụmụ mmadụ.
24
Nꞌihi na okwu Chineke gwara anyị sị, Ndụ mmadụ nile na-agabiga dị ka ahihia nke na-emesi kpọnwụọ, daa. Ịma mma nile nke mmadụ na ebube ya dịkwa ka okoko osisi nke na-ama mma, ma emesịa, ọ daa nꞌala laa nꞌiyi.
25
Ma okwu Onyenwe anyị ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi. Okwu ahụ bụkwa ozi ọma ahụ anyị wetaara unu.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5