bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Peter 4
1 Peter 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 5 →
1
Ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nꞌanụ ahụ, unu kwesịkwara inwe ụdị obi ahụ o nwere. Unu kwesịrị ijikere ịhụ ahụhụ. Nꞌihi na mgbe anụ ahụ unu na-ahụ ahụhụ ime mmehie anaghị atọkwa ya ụtọ.
2
Unu atụfula oge unu ịgbaso ọchịchọ ọjọọ nile na-agụ unu agụụ, kama bụrụnụ ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi ime ihe Chineke chọrọ.
3
Nꞌoge gara aga unu tụfuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị na-amaghị Chineke ụtọ. Ndụ unu jupụtara nꞌagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ife arụsị, nke na-eduba na mmehie ọjọọ dị iche iche.
4
Ma ndụ unu na-ebi ugbu a na-eju ndị enyi unu na-amaghị Chineke anya ebe ọ bụ na unu anaghị esokwa ha ebi ndụ ọjọọ ndị ahụ ọzọ. Nke a pụkwara ime ka ha were unu na-eme ihe ọchị ma ọ bụ ilelị unu anya.
5
Ma chetanụ nke ọma na ụbọchị na-abịa mgbe ha ga-eji ọnụ ha kwupụta ihe ha mere nꞌihu Chineke onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, taa ndị na-ebi ndụ ọjọọ ahụhụ.
6
Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa ozi ọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ, ndị ahụ e kpere ikpe nꞌanụ ahụ mgbe Chineke ji mmiri bibie ụwa. E kwusaara ha ozi ọma a ime ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee ka ha dịrị ndụ nꞌime mmụọ ha dị ka Chineke si na-adịkwa ndụ.
7
Ọgwụgwụ ihe nile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuru oke, ndị nọ na njikere, na ndị na-ekpekwa ekpere.
8
Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.
9
Jirinụ obi ọma na-elerita ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọ bụla.
10
Ka onye ọ bụla jiri onyinye pụrụ iche Chineke nyere ya na-enyere ndị ọzọ aka. Bụrụnụ ndị ji onyinye dị iche iche Chineke nyere unu na-achịzi ezinụlọ Kraịst nke ọma.
11
Ọ bụrụ na Chineke nyere gị onyinye izisa ozi ọma na-ezisa ya dị ka a ga-asị na Chineke si nꞌọnụ gị na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enyere ndị ọzọ aka, were ike ahụ nile Chineke nyere gị mee ya. Ka e site nꞌime ihe nile nye Chineke otuto site nꞌaha Jisọs Kraịst Onyenwe ike na otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.
12
Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ.
13
Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè.
14
Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe ọ bụla a na-abụ unu ọnụ, ma ọ bụ na-ekwutọ unu, nꞌihi na unu bụ ndị na-eso Kraịst. Nke a na-ezipụta na Mmụọ ahụ dị ebube, Mmụọ Chineke, bi nꞌime unu.
15
Ka onye ọ bụla nꞌime unu ghara ịta ahụhụ nꞌihi na o gburu mmadụ ma ọ bụ dị ka onye ohi, ma ọ bụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nꞌaka ike.
16
Ma ihere ekwesịghị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke ekele na a na-akpọ unu ndị Kraịst.
17
Nꞌihi na oge ikpe ikpe eruola, ọ ga-amalịtekwa nꞌebe ndị Chineke nọ. Ọ̀ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwereghị na Kraịst?
18
Ọ̀ bụrụ na ọ ga-esi ike ịzọpụta ndị ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie?
19
Ya mere, ọ bụrụ na unu na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, gaanụ nꞌihu na-eme ihe ziri ezi. Nyefeekwanụ onwe unu nꞌaka Chineke onye kere unu, onye kwesịrị ntụkwasị obi.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5