bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Peter 2
1 Peter 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 3 →
1
Ya mere, sitenụ nꞌajọ omume unu pụta, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, ndị na-ekwutọ mmadụ ihe ha.
2
Ọ bụrụ na unu edetụla obi ebere Onyenwe anyị ite, mara na ọ dị mma, na-adịnụ dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ndị agụụ ịṅụ mmiri ara na-agụ. Bụrụnụ ndị ọ na-agụ agụụ ịṅụ mmiri ara ka unu bụrụ ndị na-eto eto, na ndị a zọpụtara.
4
Bịakwutenụ Kraịst, oke nkume ahụ dị ndụ, nke ụmụ mmadụ kpọrọ ihe efu, ma nke Chineke họpụtara mee ya ka ọ bụrụ onyenwe nsọpụrụ.
5
Bịakwutenụ Chineke dị ka nkume dị nsọ, ka e were unu wuo ụlọ ukwu ahụ dị nsọ. Ebe unu ga-eje ozi dị ka ndị nchụaja dị nsọ. Nꞌihi na unu bụ ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja dị nsọ, nke na-atọ Chineke ụtọ site na Jisọs Kraịst.
6
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ na-ekwu sị, “Ahọpụtala m Kraịst ka ọ bụrụ nkume dị oke ọnụ ahia, nke m ga-eji wusie isi nkuku ụlọ nzukọ m bụ chọọchị m ike. Agaghị m ekwekwa ka ihere mee onye ọ bụla kweere na ya.”
7
Ma Kraịst bụ nkume dị oke ọnụ ahịa nye unu ndị kwere ekwe, ma nꞌebe ndị ahụ na-ekweghị ekwe nọ ọ bụ “Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, nke e mere ugbu a ka ọ bụrụ nkume kachasị mkpa nꞌụlọ ahụ.”
8
Nꞌebe ọzọ nꞌime akwụkwọ nsọ e kwuru sị, “Nke a bụ nkume ahụ ga-eme ka ụfọdụ ndị mmadụ maa nꞌọnya, ọ bụkwa nkume ga-eme ka ha daa.” Ha ga-abụ ndị ọnya mara nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌokwu ahụ. Nꞌihi ya ahụhụ dịịrị ha, dị ka uche Chineke si dị, bụ na ha ga-ada.
9
Ma unu abụghị ndị ahụ ga-ada ada. Kama unu bụ agbụrụ Chineke ji aka ya họpụta. Unu bụ ndị nchụaja onye eze ahụ. Unu bụ ndị dị nsọ, ndị nke Chineke nꞌonwe ya. Unu bụ ndị a họpụtara ka ha kwusaa ọrụ ebube Chineke, onye ahụ si nꞌọchịchịrị kpọbata unu nꞌime ìhè ya.
10
Nꞌoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mgbe ochie, unu amaghị ihe ọ bụla banyere obi ebere Chineke, ma ugbu a obi ebere ya erutela unu aka.
11
Nꞌihi ya ndị enyi m, ana m arịọ unu, dị ka ndị ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ unu bụ nꞌụwa a na-asị unu, unu enyefela onwe unu nꞌaka ihe na-agụ unu agụụ nꞌihi na ha bụ ihe na-alụso mkpụrụ obi unu agha.
12
Ka ndụ unu na-ebi nꞌetiti ndị na-amaghị Chineke bụrụ ihe e ji ama atụ. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha ghara inwe ọnụ, ọ bụladị mgbe ha chọrọ ikwutọ unu. Ndụ unu na ọrụ ọma unu ga-eme ka ha ghọta ma tookwa Chineke nꞌụbọchị Kraịst ga-alọghachi.
13
Ana m arịọ unu nꞌaha Onyenwe anyị ka unu doo owe unu nꞌokpuru ọchịchị nile. Sọpụrụnụ ndị eze na ndị isi ọchịchị obodo.
14
Sọpụrụnụ ndị na-ejere ndị isi ọchịchị ozi nꞌihi na ha bụ ndị e zitere ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ na itokwa ndị na-eme ezi ihe.
15
Ọ bụ uche Chineke ka unu site nꞌihe ọma unu na-eme na ndụ unu kpuchie ọnụ ndị nzuzu, na okwu na-abaghị nꞌihe ha na-ekwu megide ozi ọma ahụ ha na-amaghị ihe ọ pụrụ imere ha, na ike dị nꞌime ya.
16
Bienụ ndụ unu dị ka ndị na-anọghị nꞌokpuru iwu. Ma unu ejikwala onwunwe unu nwe onwe unu eme ihe ọ bụla masịrị unu. Unu ejila ya eme ihe ọjọọ, kama na-ebinụ ndụ unu ime nanị ihe Chineke chọrọ mgbe nile.
17
Sọpụrụnụ mmadụ nile. Na-ahụkwanụ ndị nile kwere ekwe nꞌanya. Na-atụnụ egwu Chineke Nna, na-asọpụrụnụ ndị na-achị achị.
18
Ndị bụ odibo ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye nanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obi ọma nꞌebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.
19
Chineke ga-agọzi unu ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachi obi na-edi ahụhụ ga-adakwasị unu nꞌihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ.
20
Unu maara na o nweghị otuto ọ bụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ unu mere. Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachi obi mgbe a na-ata unu ahụhụ nꞌihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-atọ Chineke ụtọ.
21
Ọ bụ nꞌihi ime ihe dị otu a ka Chineke ji kpọọ unu, nꞌihi na Kraịst sitere nꞌụzọ dị otu a hụọ ahụhụ nꞌihi unu. Ọ bụkwa ihe ịma atụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya.
22
O nweghị mgbe ọ bụla Kraịst mehiere, o nwekwaghị mgbe ọ bụla onye ọ bụla nụrụ okwu ụgha nꞌọnụ ya.
23
O kwutọghị onye ọ bụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọ bụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama nanị ihe o mere bụ iwere ihe nile nyefee nꞌaka Chineke onye na-ekpe ikpe ziri ezi.
24
Nꞌelu obe ahụ, Kraịst buuru mmehie anyị nile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị, ma dịrị ndụ nꞌebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site na mpa ọnya dị ya nꞌahụ ka o ji gwọọ anyị.
25
Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a e meela ka unu laghachikwute onye na-azụ unu dị ka atụrụ, na onye na-echebe mkpụrụ obi unu.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5