bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
1 Peter 5
1 Peter 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
1
Mụ onwe m, onye bụkwa okenye chọọchị, na-agwa ndị okenye chọọchị nile nọ nꞌetiti unu okwu a. Eji m anya m abụọ hụ Kraịst mgbe ọ nwụrụ nꞌelu obe. Aga m esokwa keta oke nꞌebube ya na otuto ga-abụ nke ya mgbe ọ lọghachiri.
2
Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.
3
Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha.
4
Nke a ga-eme ka unu nata ụgwọ ọrụ iketa oke nꞌebube ahụ na-agaghị agwụ agwụ, mgbe onye ọzụzụ atụrụ dị ukwuu ahụ bịara.
5
Nꞌotu aka ahụ, unu ụmụ okorọbịa, doonu onwe unu nꞌokpuru ndị bụ okenye. Unu nile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nꞌihi na Chineke na-enye onye dị umeala nꞌobi amara na ngọzi ya, ma onye mpako ka ọ na-eguzo imegide.
6
Nꞌihi nke a, werenụ obi dị umeala doo onwe unu nꞌokpuru Chineke onye dị ike. Mgbe oge ya rukwara ọ ga-eweli unu elu.
7
Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.
8
Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi.
9
Guzosienụ ike nꞌokwukwe unu mgbe ọ ga-alụso unu ọgụ. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nꞌụdị ahụhụ a unu na-ahụ nꞌụwa nile.
10
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.
11
Ka ike nile bụrụ nke ya ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.
12
Ọ bụ site nꞌinyeaka Saịlas ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole a dị nꞌime akwụkwọ a. Dị ka unu maara nke ọma, Saịlas bụ nwanna anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ olileanya m na a ga-eji ihe m dere nꞌebe a gbaa unu ume, nꞌihi na edeere m unu ihe bụ eziokwu gbasara otu Chineke si agọzi ndị ya. Ihe nile m dere nꞌebe a bụ ihe ga-enyere unu aka iguzosi ike nꞌịhụnanya ya.
13
Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke Chineke họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu.
14
Jirinụ isurịta ọnụ ịhụnanya ndị Kraịst kelerịtaa onwe unu. Ka udo Chineke dịnyere unu nile nọ nꞌime Kraịst.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
All chapters:
1
2
3
4
5
Recommended Reading
Commentary
1 Peter Commentaries
→
Devotional
1 Peter Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→