bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Galatians 1
Galatians 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 2 →
1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m, Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi. Ọ bụghị mmadụ kpọrọ m ịbụ onyeozi, kama ọkpụkpọ m si nꞌaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka Kraịst site na dnị nwụrụ anwụ bilie.
2
Ndị sokwa m na-ede akwụkwọ a, bụ ụmụnna anyị nile ndị mụ na ha nọ nꞌebe a. Ọ bụkwa unu nzukọ Kraịst dị nꞌobodo Galetia ka anyị na-edetara akwụkwọ a.
3
Ka amara na udo nke na-esite nꞌaka Chineke bụ Nna anyị na nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst apụta dịnyere unu nile.
4
Ọ bụ Kraịst nwụrụ nꞌihi mmehie anyị dị ka Chineke Nna zubere na ọ ga-anwụ, ịgbapụta anyị site nꞌụwa ọjọọ a, nke anyị bi nꞌime ya.
5
Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.
6
O juru m anya, na unu esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe unu, na-agbaso ozi ọma ọzọ, nke na-abụghị ozi ọma Chineke, Onye jiri amara ya, na ịhụnanya ya, kpọbata unu, ime ka unu keta ndụ ebighị ebi ahụ ọ na-enye site na Kraịst.
7
Nꞌihi na ọ dịghị ozi ọma ọzọ dị, ma ọ bụghị nanị ozi ọma nzọpụta ahụ anyị kwusaara unu. Ma ụfọdụ mmadụ a, ndị na-agbanwe ozi ọma Kraịst, na eziokwu dị nꞌime ya, na-eduhie unu ime ka unu si nꞌezi ụzọ jehie.
8
Ka ikpe ọmụma Chineke dị nꞌisi onye ọ bụla, ma mụ onwe m kwa, nke ga-ekwusara unu ozi ọma ọzọ dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị kwusaara unu. Ee, ka ikpe ọmụma dịkwa, ọ bụladị nꞌisi mmụọ ozi ọ bụla si nꞌeluigwe bịa kwusaara unu ozi ọma ọzọ dị iche. Ka m kwuokwa ya ọzọ, “Ikpe ọmụma Chineke ga-adakwasị onye ọ bụla kwusaara unu ozi ọma dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị buru ụzọ kwusaara unu.”
10
Eji m aka na unu na-ahụ ugbu a, na achọghị m isite nꞌokwu ire ụtọ, mee ka unu nabata m, kama ihe m chọrọ bụ nanị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Nꞌihi na a sị na m chọrọ ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ onye na-ejere Kraịst ozi.
11
Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na ozi ọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nꞌuche ya, kama ọ bụ ihe si nꞌobi Chineke Nna anyị pụta.
12
Nꞌihi na anataghị m ozi ọma ahụ site nꞌaka mmadụ ọ bụla, ọ dịkwaghị onye ọ bụla ziri m ya, kama ọ bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya bụ onye kpughere ya nye m.
13
Amaara m na unu amatala ihe banyere ndụ m nꞌoge gara aga, otu m si bụrụ onye weere onwe ya nye nꞌihi ofufe ndị Juu, na otu m siri sogbuo nzukọ Kraịst nꞌebe nile, ma gbalịsiekwa ike imegide ya.
14
Abụ m otu nꞌime ndị a maara aha ha nꞌetiti ndị ọgbọ m, nꞌihe banyere ofufe ndị Juu. Enwekwara m oke ịnụ ọkụ nꞌobi ịgbaso, na idebezu ụkpụrụ na omenala ofufe ndị Juu, nke nna nna anyị ha nyere anyị nꞌaka idebe.
15
Ma mgbe m na-eme ihe ndị a, ọ dị otu ihe mere. Nꞌihi na tupuu a mụpụta m site nꞌafọ nne m, Chineke esitelarị nꞌamara ya họpụta m, ịbụ onye nke ya. O sitekwara nꞌamara ya kpọọ m ka m bụrụ onyeozi ya.
16
Chineke mere ka m mata Ọkpara ya, ka m nwee ike ikwusara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere ya. Mgbe Chineke zipụrụ m ikwusa ozi ọma ya nꞌetiti ndị mba ọzọ, o nweghị onye ọ bụla m jewkuru ka o zi m ihe ọ bụla.
17
Agaghị m Jerusalem ịhụ ndị buru m ụzọ bụrụ ndị ozi, kama e jere m nꞌime ọzara Arebia. Mgbe m nọchasịrị nꞌebe ahụ, alọghachiri m azụ nꞌobodo Damaskọs.
18
Ọ bụ mgbe afọ atọ gasịrị, ka m gara Jerusalem ileta Pita. Mụ na ya nọkọrọ ụbọchị iri na ise nꞌime Jerusalem.
19
Ma ọ dịkwaghị onyeozi ọzọ mụ na ya hụrụ anya, karịa kwa Jemes nwanne Onyenwe anyị Jisọs.
20
Ana m agwa unu okwu a nꞌihu Chineke, onye maara na ha bụ eziokwu. Ihe ndị a m na-edegara unu abụghị okwu ụgha.
21
Mgbe m si Jerusalem pụta, agara m Siria na Silisia.
22
Ma ndị Kraịst nọ na chọọchị nile dị nꞌala Judia amaghị onye m bụ.
23
Ihe ha ma banyere m, bụ nanị ihe ndị ọzọ gwara ha, na “Onye ahụ na-esogbu ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst nꞌoge gara aga, na-ekwusazi ozi ọma ahụ ọ gbalịsịri ike imegide nꞌoge ahụ.”
24
Ha nyere Chineke otuto nꞌihi na echegharịala m.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6