bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Galatians 3
Galatians 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 4 →
1
Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galetia! Ònye bụ dibia ahụ tara ose gbụọ unu nꞌanya, ime ka unu gharakwa ịghọta ihe ọnwụ Kraịst pụtara, dị ka unu si ghọta ya mgbe m kọwaara unu ya na mbụ?
2
Zaanụ m otu ajụjụ a m chọrọ ịjụ unu. Olee otu unu si nata Mmụọ Nsọ? Ọ̀ bụ site nꞌidebe ihe iwu kwuru, ka ọ bụ site nꞌozi ọma unu nụrụ, na nkwere unu kweere?
3
Ọ̀ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Ebe unu na-esiteghị nꞌidebe iwu nata Mmụọ Nsọ na mbụ, ùnu si aṅaa chee na idebe iwu ga-eme ka unu bụrụ ndị Kraịst tozuru oke ugbu a.
4
Bịaa! ahụhụ ndị a nile unu tara nꞌihi na unu bụ ndị Kraịst, ha abụrụla nke efu? Nꞌezie, omume unu gbara m gharịị.
5
Ka m jụọkwa unu ajụjụ ọzọ, Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, na ọrụ ebube ọ rụrụ nꞌetiti unu, ò mere ha nꞌihi iwu unu debere? Ka ọ bụ nꞌihi na unu nụrụ ma kwerekwa ozi ọma ahụ?
6
Nke a bụkwa ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere Eberaham sị, Chineke gụrụ ya nꞌonye ezi omume nꞌihi na o kweere na Chineke ga-emezu nkwa o kwere.
7
Matanụ nke a, na ndị bụ ụmụ Eberaham nꞌezie bụ ndị nile na-atụkwasị Chineke obi dị ka Eberaham mere.
8
Akwụkwọ nsọ lere anya oge ahụ dị nꞌihu, nke bụ ugbu a, mgbe Chineke ga-azọpụta ndị mba ọzọ, site nꞌokwukwe ha nwere nꞌime ya. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham okwu nꞌoge gara aga sị ya, “Aga m agọzi ndị nile tụkwasịrị m obi na mba dị iche iche, dị ka i si tụkwasị m obi.” Ya mere ndị nile tụkwasịrị Kraịst obi, bụkwa ndị na-eso Eberaham eketa ngọzi ahụ Chineke gọziri ya.
10
Ma ndị nile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nꞌihi na ha debere iwu ndị Juu, ka ọbụbụ ọnụ Chineke na-adakwasị. Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọ bụla na-edebeghị ọ bụladị otu nꞌime iwu nile e dere nꞌakwụkwọ iwu Chineke.”
11
Ugbu a ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọ bụla Chineke ga-agụ nꞌonye ezi omume nꞌihi na o debere iwu. Akwụkwọ nsọ agwala anyị na ọ bụ nanị site nꞌịtụkwasị Chineke obi ka mmadụ ọ bụla pụrụ inwe ndụ.
12
Leenụ ka ụzọ ịtụkwasị Chineke obi si dị iche site nꞌụzọ nke idebe iwu. Nꞌihi na iwu kwuru na a ga-azọpụta onye na-edebe iwu nanị ma o debezuchara iwu nile Chineke nyere.
13
Ma Kraịst agbapụtala anyị site nꞌọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. O bokwasịrị onwe ya ịbụ ọnụ gaara abụ nke anyị nꞌihi mmehie anyị. Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a na-akwụba nꞌelu osisi.”
14
Ugbu a Chineke nwere ike iji ngọzi ahụ o kwere Eberaham na nkwa gọziekwa ndị mba ọzọ. Anyị nile kwa, dị ka ndị Kraịst, nwere ike isite nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya nata Mmụọ Nsọ ahụ e kwere na nkwa.
15
Unu maara ụmụnna m na mgbe mmadụ kwere mmadụ ibe ya nkwa, nkwa ahụ na-adịgide ma ọ bụrụ na e dee ya nꞌakwụkwọ, ma ọ bụrụkwa na onye kwere nkwa edekwasị aha ya nꞌakwụkwọ ahụ. Onye kwere ụdị nkwa a agaghị emesịa gbanwee uche ya kpebie ime ihe ọzọ dị iche.
16
Otu a kwa, Chineke kwere Eberaham na nwa ya nkwa. Ma nkwa a Chineke kwere dịịrị nanị otu nwa Eberaham, onye bụ Kraịst. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na nkwa ahụ adịrịghị ụmụ Eberaham nile.
17
Ihe m na-akọwa bụ nke a: Chineke ekweela nkwa ịzọpụta ndị sitere nꞌokwukwe bịakwute ya. O kwuola ya, dee ya nꞌakwụkwọ, mgbanwe ọ bụla apụghị ịdịkwa. Ọ bụ ezie na mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ gasịrị, Chineke mesịrị nye ndị Juu iwu iri ya, ma nke a apụtaghị na a kagbuola nkwa mbụ ahụ Chineke kwere Eberaham ịzọpụta mmadụ site nꞌokwukwe.
18
Ọ bụrụ na a na-esite nꞌidebe iwu zọpụta anyị, o gosiri na nke a bụ ụzọ ọhụrụ Chineke si anabata anyị. Ọ bụkwa ụzọ dị iche site na nke Eberaham, onye Chineke nabatara nꞌihi na o kweere na Chineke ga-emezu nkwa ya.
19
Gịnị mere Chineke ji nye mmadụ iwu? Chineke nyere iwu ndị a igosi na mmehie dị, na mmehie bara ụba. Ma e mere ka iwu ndị a dịgide nanị tutuu ruo mgbe Mkpụrụ ahụ bịara, onye bụ nwa Eberaham ahụ nkwa Chineke dịịrị. Mgbe Chineke nyere iwu ya o sitere nꞌaka mmụọ ozi ya nye iwu ahụ. Ọ bụkwa mmadụ natara iwu ahụ nyeruo ya ụmụ Izirel.
20
Ebe ọ bụ na o nwere onye natara iwu a nyeruo ya ndị kwesịrị ịnata ya, o gosiri na nke a abụghị mmezu nkwa ahụ. Nꞌihi na ọ dịghị mkpa na a ga-enwe mmụọ ozi ma ọ bụ onye nnyeru ọzọ dị iche, ndị ga-agba ama banyere mmezu Chineke mezuru nkwa o kwere. Nꞌihi na mmezu nkwa ahụ dịịrị, ma daberekwa nanị na Chineke.
21
Nke a ọ̀ na-egosi na iwu Chineke na nkwa ya na-emegide onwe ha? Mba! Chineke ekwela! Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa Chineke inye anyị ụzọ ọzọ a pụrụ isi gbapụta anyị site nꞌagbụ mmehie.
22
Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na anyị bụ ndị mmehie kere agbụ. Ụzọ mgbapụ dịịrị anyị bụ inwe okwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.
23
Tupuu Jisọs Kraịst abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutuu ruo mgbe anyị ga-enwere onwe anyị site nꞌịtụkwasị Kraịst Onye nzọpụta ahụ na-abịa obi.
24
Iwu ahụ dịkwa ka onye ozizi anyị, iduzi anyị nꞌụzọ anyị ga-agbaso, tutuu Kraịst abịa, mee ka anyị bụrụ ndị ezi omume nꞌihu Chineke, site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya.
25
Ma ebe ọ bụ na Kraịst abịala, iwu ndị ahụ adịkwaghị anyị mkpa ịbụ ihe ga-eche anyị, na ihe ga-edu anyị bịa nꞌebe Kraịst nọ.
26
Nꞌihi na anyị nile abụrụla ụmụ Chineke ugbu a, site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs.
27
Anyị nile kwa, ndị e sitere na baptizim e mere anyị, mee ka e jikọta anyị na Kraịst nꞌotu, abụrụla ndị e ji ọdịdị Kraịst kpuchie.
28
Ọ dịkwaghị ihe dị iche ugbu a. Nkewa ọ bụla adịkwaghị. A naghị ahụkwa anyị dị ka ndị Juu, ma ọ bụ ndị Griik, ma ọ bụ ndị ohu, ma ọ bụ ndị nwere onwe ha, ma ọ bụkwanụ ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị, kama anyị nile bụ ndị nke Kraịst, ndị e jikọtara nꞌotu nꞌime Kraịst Jisọs.
29
Ọ bụrụkwa na anyị bụ ndị Kraịst, anyị bụkwa mkpụrụ Eberaham. Nkwa nile Chineke kwere Eberaham bụkwa nke anyị.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6