bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Galatians 6
Galatians 6
Igbo 1988
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
1
Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi?
2
Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma sitenụ otu a debezuo iwu Onyenwe anyị.
3
Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌetiti unu echee na ya bụ onye dị mkpa, onye na-apụghị iweda onwe ya ala mee ihe ndị a, onye ahụ na-eme onwe ya onye nzuzu. O nwekwaghị ihe onye ahụ bụ nꞌezie.
4
Ka onye ọ bụla nꞌetiti unu ghọta ma kpebie nꞌobi ya na ihe ọ na-eme ziri ezi. Mgbe ahụ ọ ga-enwe afọ ojuju nꞌime onwe ya na ọrụ ya bụ ezi ọrụ. Ọ gaghị adịkwa mkpa na ọ ga-eji onwe ya tụnyere onye ọzọ.
5
Anyị nile nꞌotu nꞌotu kwesịrị ibu ibu ịta ụta dịrị anyị.
6
Ka ndị nile a na-ezi okwu Chineke kenye ndị na-ezi ha ihe, ihe ọma nile ha nwere.
7
Unu ekwela ka e duhie unu, nꞌihi na mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịgbaketa Chineke azụ, ghara ịta ahụhụ dịrị ya, nꞌihi omume ahụ. Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-ewetakwa nꞌubi ya.
8
Onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ anụ ahụ ya, ga-esitekwa nꞌanụ ahụ ahụ webata ọnwụ dị ka ihe ubi, ma onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ Mmụọ Nsọ, ga-esite na Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.
9
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nꞌihi na mgbe e mesịrị, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzi dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
10
Nꞌihi nke a, dị ka anyị si nwee oge, ka anyị na-arụ ezi ọrụ nꞌebe mmadụ nile nọ, ma nke ka nke, ka anyị na-arụ ezi ihe, karịsịa, nꞌebe ụmụnna anyị nꞌime Kraịst nọ.
11
Aga m eji aka m depụta okwu ndị a m chọrọ ka unu gụọ. Leenụ otu mkpụrụ akwụkwọ m ji dee ha si dị okpotokpo.
12
Ndị ozizi ahụ na-abịakwute unu, na-agbalị iduhie unu ka e bie unu ugwu, na-eme ya nꞌihi otu ihe. Ha chọrọ ka ndị mmadụ mara ha, ka ha si otu a gbanarị mkpagbu a gaara akpagbu ha, ma ọ bụrụ na ha kwusaa sị na ọ bụ obe Kraịst nanị nwere ike ịzọpụta anyị.
13
Ndị ozizi ahụ na-ezi unu na obibi ugwu bara uru, adịghị agbalị idebe iwu ndị Juu ndị ọzọ. Ma ha chọrọ ka e bie unu ugwu, ka ha site na ya na-anya isi, na unu bụ ndị na-eso ụzọ ha.
14
Ma Chineke ekwela ka m nyaa isi nꞌihe ọ bụla karịakwa nꞌobe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌobe ahụ ka ihe nile dị nꞌụwa, nke na-atọ m ụtọ, na nke na-agụ m agụụ, ji bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Ụtọ nke ụwa na-enwetakwa site nꞌaka m, abụrụkwala ihe nwụrụ anwụ.
15
O nweghị ihe ọ bụla dị iche nꞌime ya, ma e biri anyị ugwu ma e bighị anyị ugwu. Ihe dị mkpa bụ ma a gbanweela anyị nꞌezie, ịbụ ndị dị ọhụrụ na ndị dị iche.
16
Ka udo na ebere dinyere ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka ụkpụrụ ndị a nile si dị. Ka udo na ebere dịkwara ndị nile nọ ebe nile, bụ ndị nke Chineke nꞌezie.
17
Bikonụ, site ugbu a gaa nꞌihu, achọghị m ka onye ọ bụla nyee ndụ m nsogbu, nꞌihi ihe ndị a. Nꞌihi na ebu m nꞌahụ m, mpa apịpịa nile a pịara m, na ọnya nile ndị iro Jisọs nyere m nꞌahụ, nke na-egosi na abụ m odibo Jisọs nꞌezie.
18
Ụmụnna m, ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu nile.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
All chapters:
1
2
3
4
5
6