bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Galatians 2
Galatians 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 3 →
1
Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas na Taitọs so laghachi Jerusalem nke ugbu abụọ a.
2
Agara m Jerusalem nꞌihi na ọ bụ uche Chineke ka m gaa. Na nzukọ nzuzo nke mụ na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere ozi ọma nke m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Nꞌihi na achọghị m ka ọrụ nile m rụrụ nꞌoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu.
3
Ma ọ bụ ezie na Taitọs onye mba ọzọ so m gaa ije a, ndị isi nọ na Jerusalem akwagideghị ka e bie ya ugwu.
4
Okwu banyere obibi ugwu agaraghị adapụta, ma ọ bụghị na e nwere ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ndị na-abụkwaghị ndị Kraịst nꞌezie, ndị batara nꞌọgbakọ ahụ na nzuzo. Ndị a batara inyocha ụdị inwe onwe anyị nke anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs, na ịchọpụta ma anyị na-erubekwa isi nꞌiwu ndị Juu. Ndị a gbalịrị iji iwu ndị Juu kee anyị agbụ ime anyị ka anyị bụrụ ndị ohu nke iwu ahụ.
5
Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nꞌihe ha kwuru, nꞌihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nꞌozi ọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọ bụla.
6
Ndị isi chọọchị nile nọ nꞌebe ahụ, atụkwasịghị ihe ọ bụla nꞌozi ọma m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Ma ihe banyere ọnọdụ ha dị ka ndị ozi emetụghị m nꞌobi, nꞌihi na anyị nile bụ otu nꞌihu Chineke.
7
Kama, mgbe Pita, Jemes na Jọn, ndị bụ ndị isi chọọchị hụrụ otu Chineke si jiri m rụọ ọrụ, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, dị ka Chineke nꞌonwe ya si gọzie Pita, nꞌọrụ ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nꞌihi na ọ bụ otu Chineke ahụ nyere Pita onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị Juu, nyekwa m onyinye ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ndị isi ahụ nile nara mu na Banabas aka, gbaa anyị ume, sị anyị gaa nꞌihu nꞌọrụ anyị, ikwusa ozi ọma nꞌetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nꞌihu ịrụ ọrụ nke ha nꞌetiti ndị Juu.
10
Kama nanị otu ihe ha rịọrọ anyị, bụ ka anyị cheta inyere ndị ogbenye aka. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike inyere ha aka.
11
Ma mgbe Pita bịaruru Antiọk, atara m ya ụta nke ukwuu nꞌihu ụmụ Chineke nile, nꞌihi na ihe o mere jọrọ njọ nke ukwuu.
12
Nꞌihi na mgbe o buru ụzọ bịa Antiọk, Pita na ụmụnna anyị ndị a na-ebighị ugwu, na-erikọta nri. Ma mgbe ndị Juu, ndị Jemes zitere, bịaruru Antiọk, Pita ekwekwaghị iso ndị mba ọzọ ahụ rikọọ nri, nꞌihi na ọ na-atụ egwu ihe ndị Juu a bu iwu nꞌisi, ndị sị na ọ dị mkpa ibi mmadụ ugwu tupuu a zọpụta ya, ga-ekwu.
13
Nꞌihi ihe a Pita mere, ndị Juu nile bụ ndị Kraịst so anyị nọdụ nꞌebe ahụ, sooro nzọ ụkwụ Pita, mee ihe o mere, jụ iso ndị a irikọta nri, si otu a ghọọ ndị ihu abụọ.
14
Mgbe m hụrụ ihe ọjọọ a ha na-eme, hụ na ha adịghị agazi ije dị ka eziokwu nke ozi ọma ahụ si dị, agwara m Pita okwu nꞌihu ha nile, sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ onye Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ gị, ma ị kwụsịla idebe iwu ndị Juu, gịnị mere i ji na-agbalị ugbu a ime ka ndị mba ọzọ a debe iwu ndị Juu ahụ ị jụrụ ajụ?”
15
Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ anyị, ọ bụ ezie na anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ na-ebi ndụ mmehie,
16
ma anyị bụ ndị Juu maara na mmadụ ọ bụla na Chineke enweghị ike ịdị nꞌudo, site nꞌidebe iwu ndị Juu, kama, na udo na-adị nꞌetiti Chineke na mmadụ nanị site nꞌokwukwe anyị nwere na Jisọs ịsachapụ mmehie anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst, ka e mee ka Chineke nabata anyị, site nꞌokwukwe anyị, ọ bụghị nꞌihi na anyị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a ga-azọpụta nꞌihi na o debere iwu ndị Juu.
17
Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Kraịst obi ka ọ zọpụta anyị, mesịa chọpụta na anyị jehiere ụzọ ịtụkwasị ya obi, nꞌihi na nzọpụta dị nanị mgbe e biri anyị ugwu, na mgbe anyị debere iwu ndị Juu, ọ̀ gaghị abụ ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwuo na okwukwe anyị nwere na Kraịst abụrụla ihe wetaara anyị ịla nꞌiyi? Ma Chineke ekwela na mmadụ ga-eche ụdị echiche a banyere Onyenwe anyị.
18
Kama aga m abụ onye na-emebi iwu ma ọ bụrụ na m ebido na-akwalị ozizi ochie ahụ m na-agbalị ịla nꞌiyi, bụ ozizi nke na-asị na nzọpụta na-adịrị nanị ndị debere iwu ndị Juu.
19
Nꞌihi na abụ m onye nwụrụ anwụ nꞌebe iwu dị. Ee, ọ bụ iwu mere ka m nwụọ, ka m si otu a bụrụ onye na-adị ndụ nye Chineke. A kpọgidekọtala mụ na Kraịst nꞌobe,
20
ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nꞌime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a, nꞌanụ ahụ m, bụ nke m na-adị nꞌihi okwukwe m nwere nꞌime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nꞌanya, ma werekwa onwe ya nye ka a kpọgide ya nꞌobe nꞌihi m.
21
Ugbu a abụkwaghị m otu nꞌime ndị na-akpọ ọnwụ Kraịst ihe na-enweghị isi. Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa na Kraịst ga-abịa nwụọ.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6