bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Samuel 1
1 Samuel 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 2 →
1
Ma otù nwoke nke Ramataim-zofim, nke ugwu Efraim, di, aha-ya bu Elkena, nwa Jeroham, nwa Elaihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Efrata:
2
o nwekwara ndinyom abua; aha otù bu Hana, aha nke ibe-ya bu Penina: Penina nwere umu, ma Hana enweghi umu.
3
Nwoke a we si n'obodo-ya nārigo kwa-arọ ikpọ isi ala na ichuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha àjà n'ime Shailo. Ọ bu kwa n'ebe ahu ka umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, ndi-nchu-àjà Jehova, nọ.
4
Ubọchi ahu wee rue, Elkena we chua àjà, nye Penina nwunye-ya òkè ufọdu, nye kwa umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nile:
5
ma o nyere Hana òkè madu abua: n'ihi na ọ bu Hana ka ọ huru n'anya, ma Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.
6
Onye-nkpab͕u-ya we kpasue ya iwe nke-uku, imekpa ya aru, n'ihi na Jehova mechiri àkpà-nwa-ya.
7
Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n'ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe.
8
Elkena, bú di-ya, we si ya, Hana, n'ìhi gini ka i nākwa ákwá? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nērighi ihe? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka obi-gi jọrọ njọ? mù onwem adighi nma n'ebe i nọ kari umu-ndikom iri?
9
Hana we bilie mb͕e ha risiri ihe nime Shailo, mb͕e ha ṅusikwara ihe-ọṅuṅu. Ma Ilai, bú onye-nchu-àjà, nānọkwasi n'oche-ya n'akuku awara-uzọ ulo uku Jehova.
10
O we di Hana ilu na nkpuru-obi, o we kpere Jehova, kwasie ákwá ike.
11
Ọ we kwe nkwa, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ buru na I lekwasi anya n'ezie na nweda-n'ala nke orù-Gi nwayi, ọ buru na I chetam, ghara ichezọ orù-Gi nwayi, we nye orù-Gi nwayi nwa-nwoke, m'gēnye kwa ya Jehova ubọchi ndu-ya nile, aguba agaghi-aga kwa n'elu isi-ya.
12
O rue, mb͕e o kpere ọtutu ekpere n'iru Jehova, na Ilai nāriba ọnu-ya ama.
13
Ma Hana, ya onwe-ya nēkwu okwu n'obi-ya; nání egbugbere-ọnu-ya nēme úkpọ̀rọ́, ma anughi olu-ya: Ilai we chè na ọ ṅubigara manya ókè.
14
Ilai we si ya, Rùe ole mb͕e ka i ganāṅubiga manya ókè? wezuga manya-vine-gi n'aru gi.
15
Hana we za, si, É-è, onye-nwem, nwayi nke mọ-ya di arọ́ ka m'bu: ọ dighi manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya m'ṅuworo, kama awusirim nkpuru-obim n'iru Jehova.
16
Agula orù-gi nwayi na nwayi jọb͕uru onwe-ya: n'ihi na ọ bu n'ọtutu ntughari-uchem na nkpasu-iwem ka m'siteworo kwue okwu rue ub͕u a.
17
Ilai we za, si, La n'udo: Chineke Israel nye kwa gi aririọ-gi nke i riọworo n'aka-Ya.
18
Hana we si, Ka nwayi nke nējere gi ozi huta amara n'iru gi. Nwayi ahu we je ije-ya, rie ihe, iru-ya ab͕arughi kwa n'ihi ya ọzọ.
19
Ha we bilie n'isi-ututu, kpọ isi ala n'iru Jehova, we lata, ba n'ulo-ha, rue Rema: Elkena we mara aru Hana nwunye-ya; Jehova we cheta ya.
20
O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Hana turu ime, mua nwa-nwoke; o we kpọ aha-ya Samuel, si, N'ihi na ọ bu n'aka Jehova ka m'riọworo ya.
21
Nwoke ahu, bú Elkena, na ulo-ya nile we rigo ichuru Jehova aja arọ, na nkwa-ya.
22
Ma Hana arigoghi; n'ihi na ọ siri di-ya, rue mb͕e agēme ka nwata rapu ara, m'gēme kwa ka ọ bia, ka ewe hu ya anya n'iru Jehova, o we biri n'ebe ahu rue mb͕e ebighi-ebi.
23
Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.
24
Ma mb͕e o mere ka ọ rapu ara, o we kuru ya n'aka-ya rigo, chiri kwa oke-ehi atọ, na otù ephah utu ọka, na otù karama-akpukpọ manya-vine, we me ka ọ ba n'ulo Jehova na Shailo: nwata ahu bu nání nwata.
25
Ha we b͕ue oke-ehi ahu, we me ka nwata ahu biakwute Ilai.
26
Hana we si, Biko, onyenwe m, nkpuru-obi-gi nādi ndu, onyenwe m, Mu onwem bu nwayi ahu nke guzoro onwe-ya nso gi n'ebe a, ikpere Jehova.
27
Ekpere bayere nwata nka ka m'kpere; Jehova we nyem aririọm nke m'riọrọ n'aka-Ya:
28
ọzọ kwa, mu onwem emewo ka ariọtara ya Jehova; ubọchi nile ọ nādi ndu ya onwe-ya bu onye ariọtaworo nye Jehova. Ilai we kpọ isi ala nye Jehova n'ebe ahu.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31