bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Samuel 16
1 Samuel 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 17 →
1
Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.
2
Samuel we si, M'gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n'aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m'biaworo.
3
I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te.
4
Samuel we me ihe ahu nke Jehova kwuru, ọ biarue Bet-lehem. Ndi-okenye obodo ahu we ma jijiji izute ya, si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo?
5
Ọ we si, Ọ bu n'udo: ichuru Jehova àjà ka m'biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n'ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n'ichu-aja ahu.
6
O rue, mb͕e ha biara, na ọ huru Elaiab, o we si, N'ezie, ọ nọ n'iru Jehova, bú onye nke Ya etere manu.
7
Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi.
8
Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n'iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka.
9
Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka.
10
Jesi we me ka madu asa nime umu-ya ndikom gabiga n'iru Samuel. Samuel we si Jesi, Jehova arọputaghi ndia.
11
Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n'ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n'ebe a.
12
Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya.
13
Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema.
14
Ma Mọ nke Jehova wezugara Onwe-ya n'ebe Sọl nọ, mọ ọjọ we si n'ebe Jehova nọ me ka ọ tua egwu nke-uku.
15
Ndi-orù Sọl we si ya, Biko, le, mọ ọjọ nke Chineke nēme ka i tua egwu.
16
Biko, ka onye-nwe-ayi si ndi-orù-ya, ndi nọ n'iru gi, ka ha chọ nwoke nke mara ọkpukpọ-ubọ-akwara nke-ọma: ọ gēru kwa, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke dikwasi n'aru gi, na ọ gēwere aka-ya kpọ ubọ, ọ gādi kwa gi nma.
17
Sọl we si ndi-orù-ya, Biko, hutaranum nwoke nke nākpọ ubọ nke-ọma, me-kwa-nu ka ọ biakutem.
18
Otù nime umu-okorọbia-ya we za, si, Le, ahuwom otù nwa Jesi, bú onye Bet-lehem, onye mara ikpọ ubọ nke-ọma, ọ bu kwa dike nke bu dìnkpà, buru kwa nwoke agha, o nwe-kwa-ra uche n'okwu, buru kwa nwoke mara nma n'aru, Jehova nọye-kwa-ra ya.
19
Sọl we zigara Jesi ndi-ozi, si, Ziterem Devid nwa-gi, nke nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu.
20
Jesi we were otù inyinya-ibu nke eboro ya achicha, na otù karama-akpukpọ manya-vine, na otù nwa-ewu, we zigara Sọl n'aka Devid, bú nwa-ya.
21
Devid we biakute Sọl, guzo n'iru ya: o we hu ya n'anya nke-uku; o we ghọrọ ya onye nēbu ihe-agha.
22
Sọl we zigara Jesi ozi, si, Biko, ka Devid guzo n'irum; n'ihi na ọ hutawo amara n'irum.
23
O rue, mb͕e mọ ọjọ ahu nke Chineke di n'aru Sọl, na Devid were ubọ-akwara-ya, were aka-ya kpọ ya: aru we dajua Sọl, o we di ya nma, mọ ọjọ ahu we si n'ebe ọ nọ wezuga onwe-ya.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
Recommended Reading
Commentary
1 Samuel Commentaries
→
Devotional
1 Samuel Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→