bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Samuel 21
1 Samuel 21
Igbo 2006
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 22 →
1
Devid we biarue Nob biakute Ahimelek, bú onye-nchu-àjà: Ahimelek we ma jijiji izute Devid, si ya Gini mere nání gi onwe-gi biara, ma ọ dighi nwoke gi na ya yikọrọ?
2
Devid we si Ahimelek, bú onye-nchu-àjà, Eze enyewom ihe n'iwu, sim, Ka nwoke ọ bula ghara ima ihe ọ bula bayere ihe ahu nke mu onwem nēziga gi ozi-ya, na nke m'nyeworo gi n'iwu: emewokwam ka umu-okorọbiam mara na ha gēje n'ebe di otú a otú a.
3
Ma ub͕u a gini di n'okpuru aka-gi? nyem ob͕e achicha ise n'aka, ma-ọbu ihe agāchọta.
4
Onye-nchu-àjà ahu we za Devid, si, Ọ dighi achicha anēdoghi nsọ di n'okpuru akam, ma achicha nsọ di; nání ọ buru na umu-okorọbia ahu edebewo onwe-ha ghara imetu nwayi aru.
5
Devid we za onye-nchu-àjà, si ya, N'ezie, ọ buru na eb͕ochiwo ndinyom n'imetu ayi aru, dika na mb͕e gara aga mb͕e m'nāputa, ihe umu-okorọbia we di nsọ, ma nke ahu bu ije nke anēdoghi nsọ; ìhe-ha gēsi kwa aṅa ghara idi nsọ kari ta?
6
Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n'ihi na ọ dighi achicha di n'ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n'iru Jehova, idọba achicha di ọku n'elu table n'ubọchi ewepuru ya.
7
Ma otù nwoke n'etiti ndi-orù Sọl nọ n'ebe ahu n'ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n'iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.
8
Devid we si Ahimelek, Ọ̀ dighi kwa ube ma-ọbu mma-agha di n'ebe a n'okpuru aka-gi? n'ihi na ewetaghm ma mma-agham ma ihe-agham, n'ihi na okwu a nke eze bu ihe di ọku ọku.
9
Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n'ákwà n'azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n'ihi na ọ dighi ọzọ di n'ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya.
10
Devid we bilie, b͕apu n'ubọchi ahu n'iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat.
11
Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n'ite-egwú, si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?
12
Devid we tiye okwu ndia n'obi-ya, tua egwu Ekish, bú eze Gat, nke-uku.
13
O we b͕anwe omume-ya n'anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n'aka-ha, ọ ka kwa akàrà n'ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n'afu-ọnu-ya.
14
Ekish we si ndi-orù-ya, Le, unu nāhu nwoke a ka o nēme onwe-ya dika onye nāwi ara: n'ìhi gini ka unu mere ka ọ biakutem?
15
Ndi nke akam nāwi ara, hà kọrọm ukọ, na unu emewo ka nwoke a bata ime onwe-ya dika onye nāwi ara n'irum? Nwoke a, ọ̀ gābata n'ulom?
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
Recommended Reading
Commentary
1 Samuel Commentaries
→
Devotional
1 Samuel Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→