bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
1 Samuel 22
1 Samuel 22
Igbo 2006
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 23 →
1
Devid we si n'ebe ahu je, wepuga onwe-ya rue ọb͕à Adulam: umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we nu ya, ha we ridakuru ya n'ebe ahu.
2
Ha we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n'ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n'aka-ya.
3
Devid we si n'ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n'etiti unu, rue mb͕e m'mara ihe Chineke gēmerem.
4
O we duru ha bia n'iru eze Moab: ha we biri n'aka-ya ubọchi nile Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike.
5
Gad, bú onye-amuma, we si Devid, Anọdula n'ebe a ewusiri ike; je, bara onwe-gi n'ala Juda. Devid we je, ba n'oké ọhia Heret.
6
Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n'okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n'aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n'akuku ya.
7
Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n'akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?
8
na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m'nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n'obi n'ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m'nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.
9
Doeg onye Edom we za, (n'ihi na ya onwe-ya nēguzo n'akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.
10
O we juara ya ase n'aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n'uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.
11
Eze we ziga ikpọ Ahimelek nwa Ahaitub, bú onye-nchu-aja, na ulo nna-ya nile, bú ndi-nchu-àjà ndi nọ na Nob: ha we biakute eze, ha nile.
12
Sọl we si, Biko, nuru, gi nwa Ahaitub. O we si, Lem, onye-nwem.
13
Sọl we si ya, N'ìhi gini ka unu kekọtaworo onwe-unu imegidem, gi onwe-gi na nwa Jesi, n'inye ya achicha na mma-agha, na n'ijuru ya ase n'aka Chineke, ka o we bilie imegidem, iche anwu, dika ta?
14
Ahimelek we za eze, si, Ònye kwa n'etiti orù-gi nile di ka Devid? ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa di nwa eze, o wezugawo kwa onwe-ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-gi, ọ di kwa nsọpuru n'ulo-gi.
15
Ọ̀ bu ta ka m'malitere ijuru ya ase n'aka Chineke? ya burum ihe-árú: ka eze ghara ibo orù-ya ebubo ọ bula, ghara kwa ibo ulo nnam nile: n'ihi na orù-gi amaghi ihe ọ bula n'ihe a nile, nke di ntà ma-ọbu nke di uku.
16
Eze we si, I ghaghi inwu, Ahimelek, gi onwe-gi na ulo nna-gi nile.
17
Eze we si ndi-ọb͕a-ọsọ ndi nēguzo n'akuku ya, Chigharianu, me ka ndi-nchu-àjà Jehova nwua; n'ihi na aka-ha di kwa n'akuku Devid, na n'ihi na ha mara na onye nāb͕apu ka ọ bu, ma ha ekpughepughi ntim ka m'nu ya. Ma ndi-orù eze ekweghi isetipu aka-ha idakwasi ndi-nchu-àjà Jehova.
18
Eze we si Doeg, Gi onwe-gi chigharia, dakwasi ndi-nchu-àjà. Doeg onye Edom we chigharia, ya onwe-ya we dakwasi ndi-nchu-àjà, me ka ọgu ndikom anọ na ise nwua n'ubọchi ahu, bú ndi nēyi ephod nke ákwà ọcha.
19
O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.
20
Ma otù nwa-nwoke nke Ahimelek nwa Ahaitub nwere, aha-ya bu Abaiata, wepugara onwe-ya, b͕apu soro Devid.
21
Abaiata we gosi Devid na Sọl eb͕uwo ndi-nchu-àjà Jehova.
22
Devid we si Abaiata, Amaram n'ubọchi ahu, mb͕e Doeg, bú onye Edom, nọ n'ebe ahu, na ọ ghaghi igosi Sọl: mu onwem akpatawo ọnwu nke madu nile nke ulo nna-gi.
23
Ka mu na gi nọdu, atula egwu; n'ihi na onye ahu nke nāchọ ndum nāchọ ndu-gi: n'ihi na ihe-ndebe ka i bu n'akam.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
Recommended Reading
Commentary
1 Samuel Commentaries
→
Devotional
1 Samuel Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→