bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Luke 16
Luke 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 17 →
1
O we si kwa ndi nēso uzọ-Ya, Otù ọgaranya di, nke nwere onye nāchi èzí-na-ulo-ya; onye a ka eboro n'iru ya na ọ nēmefu ihe o nwere.
2
Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m'nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n'ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ.
3
Onye ahu nke nāchi èzí-na-ulo we kwue n'onwe-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na onye-nwem nānapum ọchichi-èzí-na-ulo a? Enweghi m ike igwu ala; ihere iriọ aririọ nēmem.
4
Amaram ihe m'gēme, ka, mb͕e ọ bula agēwepum n'ọchichi-èzí-na-ulo a, ka ha we kpọbatam n'ulo nke aka ha.
5
O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n'otù n'otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem?
6
Ọ si, Ọgu mb͕é manu ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, nọdu ọsọsọ, de ọgu abua na iri.
7
Mb͕e ahu ọ siri onye ọzọ, Ùgwọ ole ka gi onwe-gi ji kwa? Ọ si, Ọgu mb͕é ọka ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, de ọgu anọ.
8
Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n'ihi na o mere dika onye nwere uche: n'ihi na umu nke oge a nwere uche n'ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè.
9
Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n'àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n'ulo-ikwū ebighi-ebi.
10
Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n'ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n'oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n'ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n'oké ihe.
11
Ya mere, ọ buru na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'àkù ajọ omume, ònye gēnye ezi àkù n'aka-unu na ntukwasi-obi idebe?
12
Ọ buru kwa na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'ihe onye ọzọ nwere, ònye gēnye unu ihe nke aka unu?
13
Ọ dighi onye ọ bula nke nēje ozi nke puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anyá; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.
14
Ma ndi-Farisi, ndi nāhu ego n'anya, nuru ihe ndia nile: ha we me Ya ihe-ọchì.
15
O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke.
16
Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n'oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n'otù n'otù were ihe-ike nābà nime ya.
17
Ma ọ ka nfé ka elu-igwe na ala gabiga, kari na otù ihe dikarisiri ntà n'iwu ahu gāda.
18
Nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, nke luru kwa nwanyi ọzọ, ọ nākwa iko: onye nālu nwanyi nke di-ya rapuworo nākwa kwa iko.
19
Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:
20
ma atọb͕ọrọri otù ob͕eye n'ọnu-uzọ-amá-ya, aha-ya bu Lazarọs, nke ọnyá juru ya n'aru,
21
onye ọ nāgu kwa ka ewere irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahu dapu me ka afọ ju ya; e, ọbuná nkita nābia racha ọnyá-ya.
22
O we rue na ob͕eye ahu nwuru, ndi-mọ-ozi we bupu ya ga n'ebe ọ dabere n'obì Abraham: ọgaranya ahu nwukwara, ewe lìe ya.
23
Nime Hedis o we welie anya-ya elu, ebe ọ nọ na nmekpa-aru, ọ hu Abraham n'ebe di anya, na Lazarọs ka ọ dabere n'obì-ya.
24
Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n'ihi na anọm n'aru-ufu nime ire-ọku a.
25
Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n'ebe a, ma gi onwe-gi nọ n'aru-ufu.
26
Ma n'ihe ndia nile, emewo ka oké olùlù disie ike n'ab͕ata ayi na unu, ka ndi nāchọ isi n'ebe a gabiga ijekuru unu we ghara inwe ike, ka onye ọ bula ghara kwa isi n'ebe ahu gabiga biakute ayi.
27
O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n'ulo nnam;
28
n'ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n'ebe nmekpa-aru a.
29
Ma Abraham siri, Ha nwere Moses na ndi-amuma; ka ha nuru olu-ha.
30
O we si, É-è, nna Abraham: kama ọ buru na otù onye esite na ndi nwuru anwu jekuru ha, ha gēchèghari.
31
O we si ya, Ọ buru na ha anughi olu Moses na ndi-amuma, agaghi-eme kwa ka ha kweye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24