bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Luke 19
Luke 19
Igbo 2006
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 20 →
1
O we ba na Jeriko nāgabiga kwa n'etiti ya.
2
Ma le, otù nwoke anākpọ aha-ya Zakiọs; onye ahu bu kwa onye-isi-ọna-utu, onye ahu bu kwa ọgaranya.
3
O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n'ihi ìgwè madu, n'ihi na o toghi ogologo.
4
O we b͕a ọsọ ga n'iru, we rigo n'osisi sycomore ka ọ hu Ya anya: n'ihi na Ọ gaje igabiga n'uzọ ahu.
5
Mb͕e Jisus biaruru ebe ahu, O we le anya n'elu, si ya, Zakiọs, me ngwa, ridata; n'ihi na aghaghi m inọdu n'ulo-gi ta.
6
O we me ngwa, ridata, were kwa ọṅù kpọbata Ya.
7
Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie.
8
Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ.
9
Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham.
10
N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.
11
Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n'ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n'ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa.
12
Ya mere Ọ siri, Otù nwoke amazuru aha-ya gara ala di anya, inara ala-eze nye onwe-ya, na ilaghachi.
13
O we kpọ madu iri nime ndi-orù-ya, nye ha ọgu pound abua na iri, si ha, Zuanu ahia rue mb͕e m'gābia.
14
Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi.
15
O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n'ahia.
16
Onye mbu we bia n'iru ya, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù ọgu pound abua na iri.
17
Ọ we si ya, I mere nke-ọma, ezi orù: n'ihi na ahuru na i kwesiri ka atukwasi gi obi n'ihe dikarisiri ntà, gi buru onye nāchi obodo iri.
18
Nke-abua we bia, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù orú pound na ise.
19
O we si kwa nwoke a, Gi onwe-gi buru kwa onye-isi nke obodo ise.
20
Orù nke di iche we bia, si, Onye-nwe-ayi, le pound ise nke gi, nke m'debere n'ákwà:
21
n'ihi na aturum gi egwu, n'ihi na i bu onye aka ike: i nēweli ihe i nātọb͕ọghi, i nēwe kwa ihe n'ebe ikọghi.
22
Ọ si ya, M'gēsite n'ọnu nke gi kpe gi ikpé, ajọ orù. I mara na mu onwem bu onye aka ike, nēweli ihe m'nātọb͕ọghri, nēwe kwa ihe m'nāghaghri;
23
n'ihi gini kwa ka i nējighi were egom nye ndi nāb͕anwe ego, mu onwem gānara kwa ya na uma mb͕e m'biara?
24
O we si ndi guzoro nso, Napunu ya pound ise ahu, were ha nye onye nwere ọgu pound abua na iri ahu.
25
Ha we si ya, Onye-nwe-ayi, o nwere ọgu pound abua na iri.
26
Asim unu, na onye ọ bula nke nwere ka agēnye; ma onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.
27
Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.
28
Mb͕e O kwusiri okwu ndia, O we nāga n'iru, nārigoro Jerusalem.
29
O rue, mb͕e Ọ biaruru Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu anākpọ ugwu Olive, na O zigara madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya,
30
si, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu; mb͕e unu nābà, unu gāhu nime ya nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasigh: tọpunu ya, sekputa ya.
31
Ọ buru kwa na onye ọ bula ajua unu, si, N'ìhi gini ka unu nātọpu ya? unu gāsi otú a, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà.
32
Ndi ezigara we je, hu dika Ọ gwara ha.
33
Ma mb͕e ha nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu, ndi-nwe-ya we si ha, Gini mere unu nātopu nwa-inyinya-ibu ahu?
34
Ha we si, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà.
35
Ha we sekputa ya nye Jisus: ha we wukwasi uwe-ha na nwa-inyinya-ibu ahu, we tukwasi Jisus na ya.
36
Mb͕e Ọ nāga, ha we tusa uwe-ha n'uzọ.
37
Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi;
38
si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu.
39
Ufọdu n'etiti ndi-Farisi we si n'ìgwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, bara ndi nēso uzọ-Gi nba.
40
O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu.
41
Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,
42
si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi.
43
N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile,
44
tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi.
45
O wee ba n'ulọ uku Chineke, malite ichupu ndi nēre,
46
nāsi ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ulom gābu kwa ulo ekpere: ma unu onwe-unu mere ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.
47
O we nēzí ihe kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi nke ndi-Ju nāchọ uzọ ila Ya n'iyì:
48
ha ahughi kwa ihe ha gēme; n'ihi na ndi-Ju nile nọ Ya nso gburugburu, nānu okwu-Ya.
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 20 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24