bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Luke 22
Luke 22
Igbo 2006
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 23 →
1
Ma ememe achicha ekoghi-eko, nke anakpọ Ngabiga, nēru nso.
2
Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nāchọ uzọ ha gēsi b͕u Ya; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju.
3
Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu.
4
O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n'aka-ha.
5
Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego.
6
O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n'aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi.
7
Ma ubọchi achicha ekoghi-eko biara, nke anāghaghi ichu àjà ngabiga.
8
O we zipu Pita na Jọn, si, Ganu, doziere ayi oriri ngabiga, ka ayi we rie.
9
Ha we si Ya, Òle ebe I nācho ka ayi dozie?
10
Ọ si ha, Le, mb͕e unu batasiri nime obodo a, otù nwoke nke bū ite miri gēzute unu; sonu ya ba n'ulo nke ọ nābà nime ya.
11
Unu gāsi kwa nna-nwe ulo ahu, Onye-ozizí si gi, Òle ebe ulo-ọbìa di, ebe Mu na ndi nēso uzọm gēri oriri ngabiga?
12
Onye ahu gēgosi kwa unu ime-ulo uku di n'elu ulo akwadebeworo: dozienu n'ebe ahu.
13
Ha we je, hu dika Ọ gwara ha-ri: ha we dozie ememe ngabiga.
14
Mb͕e oge hour ahu ruru, O we nọdu na nri, Ya na ndi-ozi-Ya.
15
O we si ha, Agu gusirim ike iso unu ri oriri ngabiga nka mb͕e Mu akāhughi ahuhu:
16
n'ihi na asim unu, M'gaghi-eri ya ma-ọli, rue mb͕e ọ gēmezu n'ala-eze Chineke.
17
O we nara iko, kele kwa, we si, Naranu nka, kè kwa ya n'etiti onwe-unu:
18
n'ihi na asim unu, M'gaghi-aṅu ihe si n'osisi vine puta ma-ọli site ugbu a, rue mb͕e ala-eze Chineke gābia.
19
O we nara ob͕e achicha, kele kwa, we nyawa ya, nye ha, si, Nka bu arum nke anēnye n'ihi unu: nēmenu nka ka anu we nēchetam.
20
Mb͕e ha risiri nri-anyasi Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram, bú nke anāwusi n'ihi unu.
21
Ma le, aka onye nāraram nye diyerem n'elu table.
22
N'ihi na Nwa nke madu nāga n'ezie, dika akaworo ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Ya nye.
23
Ha we malite ijurita onwe-ha, onye ọ bu n'etiti ha gēme ihe a.
24
Esem-okwu we da kwa n'etiti ha, onye nime ha ka anāgu na ọ ka ibe-ya uku.
25
O we si ha, Ndi-eze nke mba ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi nāchi kwa ha ka anākpọ ndi nālu ọlu ọma.
26
Ma unu onwe-unu agaghi-adi otú a: kama onye ka ibe-ya uku n'etiti unu, ya di ka onye bu nwata; onye bu kwa onye-isi, ya di ka onye nēje ozi.
27
N'ihi na ònye ka ibe-ya uku, onye nānọdu na nri, ma-ọbu onye nēje ozi? ọ̀ bughi onye nānọdu na nri? ma Mu onwem di n'etiti unu ka onye nēje ozi.
28
Ma unu onwe-unu bu ndi soworom n'ọnwunwam nile;
29
Mu onwem nāb͕a kwa ndu inye unu ala-eze, dika Nnam b͕ara ndu inyem,
30
ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n'ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n'oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.
31
Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka:
32
ma Mu onwem riọrọ aririọ bayere gi, ka okwukwe-gi ghara igwu agwu: gi-onwe-gi, mb͕e i gēchighariwori, gi me kwa ka umu-nna-gi guzosie ike.
33
O we si Ya, Onye-nwe-ayi, abum onye edoziworo iso Gi ga rue ulo-nkpọrọ ru kwa ọnwu.
34
O we si, Asim i, Pita, oke-ọkuku agaghi-akwá ta, rue mb͕e i gāgọ ub͕ò atọ, si na i mataghim.
35
O we si ha, Mb͕e M'zipuru unu nējighi àkpà-ego, na àkpà-ije, na akpukpọ-ukwu, ọ̀ di ihe kọrọ unu? Ha si, Ọ dighi ihe kọrọ ayi.
36
O we si ha, Ma ub͕u a, onye nwere àkpà-ego, ya were ya, onye nwere àkpà-ije, ya were kwa ya: ma onye nēnweghi, ya re uwe-ya, zuta mma-agha.
37
N'ihi na asim unu, na ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu n'arum, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya: n'ihi na ihe dirim nwere ọgwugwu.
38
Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n'ebe a. O we si ha, O zuwo.
39
O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya.
40
Ma mb͕e O ruru n'ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n'ọnwunwa.
41
Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere,
42
si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ.
43
Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike.
44
Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala.
45
Mb͕e O biliri n'ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n'ihe-nwuta,
46
O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa.
47
Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu.
48
Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye?
49
Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue?
50
Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya.
51
Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike.
52
Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe?
53
Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.
54
Ha we jide Ya, duru Ya je, dubà kwa Ya n'ulo onye-isi-nchu-àjà. Ma Pita nēso n'ebe di anya.
55
Ma mb͕e ha funwuru ọku n'etiti obí, we nọdu ala n'otù, Pita we nọdu n'etiti ha.
56
Ma otù nwa-ab͕ọghọ huru ya ka ọ nọduru n'ìhè ọku ahu, o we legide ya anya, si, Nwoke a na Ya nọ-kwa-ra.
57
Ma ọ gọrọ, si, Nwanyi amataghim Ya.
58
Mb͕e nwa oge gasiri onye ọzọ we hu ya, si, Gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha. Ma Pita siri, Nwoke, abughim.
59
Ma mb͕e ihe dika otù oge hour gasiri onye ọzọ kwusibere ike, si, N'ezie nwoke a na Ya nọkwara: n'ihi na ọ bu kwa onye Galili.
60
Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá.
61
Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ.
62
O we pua, kwa ákwá nke-uku.
63
Ndikom ndi jidere Jisus we me Ya ihe-ọchì, pia kwa Ya ihe.
64
Ha we kechi iru-Ya, jua Ya, si, Bue amuma: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?
65
Ọtutu ihe ọzọ ka ha kwuru megide Ya, nēkwulu Ya.
66
Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si,
67
Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist, gwa ayi. Ma Ọ siri ha, Ọ buru na Mu agwa unu, unu agaghi-ekwe ma-ọli:
68
ma ọ buru na Mu aju unu ajuju, unu agaghi-aza ma-ọli.
69
Ma site n'ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n'aka-nri nke ike Chineke.
70
Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya.
71
Ha we si, Ọ̀ bu nkpà àmà gini nākpa ayi ọzọ? n'ihi na ayi onwe-ayi nuru site n'ọnu-Ya.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24