bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Luke 4
Luke 4
Igbo 2006
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 5 →
1
Ma ebe Jisus juputara na Mọ Nsọ, O si na Jọdan laghachi, Mọ ahu we duru Ya nāgaghari n'ọhia,
2
ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n'ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya.
3
Ekwensu we si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọ ob͕e achicha.
4
Jisus we za ya, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu.
5
Ọ we duru Ya rigo, we gosi Ya ala-eze nile nke elu-uwa dum madu bi na nkenke oge.
6
Ekwensu we si Ya, Gi ka m'gēnye ike a nile, na ebube-ha: n'ihi na ararawo ya nye n'akam; onye ọ bula m'chọ-kwa-ra inye ya m'nye ya.
7
Ya mere ọ buru na Gi onwe-gi gākpọ isi ala n'irum, ihe a nile gābu nke Gi.
8
Jisus we za, si ya, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.
9
O we duru Ya ga Jerusalem, guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'ebe a tuda Onwe-gi n'ala:
10
n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:
11
Ọzọ, Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.
12
Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.
13
Mb͕e ekwensu nwasiri ọnwunwa nile, o we si n'ebe Ọ nọ pua rue mb͕e ọzọ.
14
Jisus we laghachi na Galili n'ike Mọ Nsọ: ùdé-Ya we pua jesa n'ala dum di buruburu.
15
Ya onwe-ya we nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, madu nile nēnye kwa Ya otuto.
16
O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ.
17
Ewe nye Ya akwukwọ Aisaia onye-amuma n'aka. Ó we meghe akwukwọ ahu, chọta ebe edeworo ya, si,
18
Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum. N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma: O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi, Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,
19
Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma.
20
O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n'ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya.
21
O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ na nti-unu.
22
Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?
23
O we si ha, N'ezie unu gaturu m ilu a, Dibia, me ka aru Gi onwe-gi di ike: ka ihe ayi nuru na emere ha na Kapanaum ra, me kwa otú a n'ebe a n'obodo nke aka Gi.
24
O we si, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n'obodo nke aka ya.
25
Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile;
26
ma ọ dighi onye ọ bula nime ha ezigara Elaija, kama nání Zarefat, n'ala Saidon, jekuru nwanyi di-ya nwuru.
27
Ọtutu ndi-ekpenta di kwa n'Israel na mb͕e Elaisha onye-amuma; ma ọ dighi onye ọ bula nime ha emere ka ọ di ọcha, kama nání Neamam onye Siria.
28
Ọnuma we juputa ha nile n'ulo-nzukọ ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia;
29
ha we bilie, chupu Ya n'obodo ahu, duru Ya ga rue mpempe ugwu nke ewuru obodo-ha n'elu ya, ka ha we kwada Ya n'ala.
30
Ma Ya onwe-ya gabigara n'etiti ha la.
31
O we ridata na Kapanaum, otù obodo nke Galili, O we nēzi ha ihe n'ubọchi-izu-ike:
32
ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru; n'ihi na okwu-Ya di ike.
33
Otù nwoke nọ kwa n'ulo-nzukọ-ha, nke nwere mọ ọjọọ; o we were oké olu tisie nkpu ike, si,
34
pua ebe a! ginl ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? amataram, Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.
35
Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mb͕e mọ ọjọ ahu tudasiri ya n'ala n'etiti ha, o we si nime ya puta, nēmerughi ya aru.
36
Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Gini bu okwu a? n'ihi na O ji ichi-isi na ike nye ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha we puta.
37
Ùzù-Ya we tua gazue n'ebe nile nke ala di obodo ahu gburugburu.
38
O we si n'ulo-nzukọ ahu bilie, ba n'ulo Saimon. Ma oké aru-ọku jisiri nne nwunye Saimon ike; ha we kpe ekpere banyere ya.
39
O we guzo n'akuku ya, bara aru-ọku ahu nba; aru-ọku ahu we rapu ya: ngwa ngwa o we bilie nēje-kwa-ra ha ozi.
40
Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.
41
Ndi-mọ ọjọ puta-kwa-ra n'ọtutu madu, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ma Ọ nābara ha nba, O kweghi kwa ka ha kwue okwu, n'ihi na ha matara na Ya bu Kraist.
42
Ma mb͕e chi bọrọ, Ọ pua ga n'ebe bu ọhia: igwè madu nile we nāchọ Ya, we biakute Ya, malite kwa ib͕ochi Ya, ka Ọ ghara isi na nke ha ga ebe ọzọ.
43
Ma Ọ siri ha, Aghaghm izì kwa obodo nile ọzọ ozi ọma ala-eze Chineke: n'ihi na eziterem ime nka.
44
O nēkwusa kwa okwu Chineke n'ulo-nzukọ nile nke Galili.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24