bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Song of Solomon 1
Song of Solomon 1
Igbo 2006
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 2 →
1
Abù nke abù, nke diri Solomon.
2
Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum: N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine.
3
Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma; Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu; N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya.
4
Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.
5
Onye oji ka m'bu, ma amaram nma, Unu umu-ndinyom Jerusalem, Dika ulo-ikwū nile nke Kida, Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.
6
Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji, N'ihi na anyanwu achawom. Umu nke nnem wesaram iwe di ọku, Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile; Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.
7
Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya, Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie: N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi, N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?
8
Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom, Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu, Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.
9
Inyinyam nke di n'ub͕ọ-ala Fero Ka m'wereworo gi tuara, gi eyìm.
10
Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa, Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.
11
Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi, Ya na nkpọchi ọla-ọcha.
12
Mb͕e eze nọ n'oche-ya di buruburu, Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya.
13
Ùkwù myrrh ka onye ihe-ya nātọm utọ burum, N'etiti aram abua ka ọ nānọ ọnọdu-abali.
14
Uyọkọ nke okoko henna ka onye ihe-ya nātọm utọ burum N'ubi-vine nke En-gedi.
15
Le, i mara nma, eyìm; le, i mara nma; Anya-gi abua di ka nduru.
16
Le, i mara nma, gi onye ihe-gi nātọm utọ, e, i di utọ: Ọzọ, ebe ayi nēdina nācha akwukwọ ndu.
17
Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar, Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8