bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Song of Solomon 8
Song of Solomon 8
Igbo 2006
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
1
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i dirim ka nwa-nnem nwoke, Nke miworo ara abua nke nnem! Mb͕e m'huru gi n'èzí, m'gēsutu gi ọnu; Ma ọ dighi onye gēledam anya.
2
M'gēduru gi, me ka i ba n'ulo nnem, I gēzím ihe; M'gēme ka i ṅua manya-vine ufọdu etiyere ihe-ísì-utọ, Ka i ṅu kwa manya pomegranate nkem ufọdu.
3
Aka-ekpe-ya gādi n'okpuru isim, Aka-nri-ya gāb͕akum.
4
Unu umu-ndinyom Jerusalem, ab͕am unu iyi, Gini mere unu ji akpọte ihu-n'anya? ma-ọbu gini mere unu ji eme ka ọ teta? Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.
5
Ònye bu nwayi a nke nēsi n'ọzara arigota, Dabere n'aru onye ihe-ya nātọ ya utọ? N'okpuru osisi apple ka m'kpọtere gi: N'ebe ahu ka ime gi nēme nne-gi, N'ebe ahu ka ime nēme ya, o we muputa gi.
6
Tukwasim dika nb͕a-aka-akàrà n'obi-gi dika nb͕a-aka-akàrà n'ogwe-aka-gi: N'ihi na ihu-n'anya di ike dika ọnwu; Ekworo siri ike dika ala-mọ: Nnwupu-ya nile bu nnwupu nke ọku, Ire-ọku nke Ja onwe-ya.
7
Ọtutu miri apughi imenyu ihu-n'anya, Osimiri nile agaghi-erikpu kwa ya: Ọ buru na onye ọ bula gēnye àkù nile nke ulo-ya n'ihi ihu-n'anya, Agēleda ya anya nke-uku.
8
Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà, Ma ọ dighi ara ọ kpuru: Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayi N'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?
9
Ọ buru na ọ bu mb͕idi, Ayi gēwukwasi ya ulo-elu nke ọla-ọcha: Ma ọ buru na ọ bu ọnu-uzọ, Ayi gēji ibo cedar mechibido ya.
10
Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya: Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo.
11
Solomon nwere ubi-vine nime Beal-hamon; Ọ nyere ubi-vine ahu n'aka ndi-nche; Onye ọ bula n'ọnọdu nkpuru-ya gēweta nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri.
12
Ubi-vine nkem, nke m'nwere, di n'irum: Nnù abua na ọgu iri ahu gādiri gi, Solomon, Ọgu iri gādi-kwa-ra ndi nēche nkpuru-ya.
13
Gi onye bi n'ubi ab͕ara ogige, Ndi ejikọtara gi na ha nāṅa nti olu-gi: Mem ka m'nuru ya.
14
B͕alaga, gi onye ihe-gi nātọm utọ, Yi kwa mb͕ada ma-ọbu nwa-ele N'elu ugwu nile nke uda di iche iche.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8