bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Song of Solomon 3
Song of Solomon 3
Igbo 2006
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 4 →
1
N'elu ihe-ndinam n'abali ka m'chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.
2
M'siri, Biko, ka m'bilie, jegharia n'obodo buruburu, N'amá nile na n'ebe nile sara mbara, Ka m'chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.
3
Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum: M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya?
4
Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga, Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya: Ejiderem ya, arakwaghm ya aka, Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem, Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem.
5
Unu umu-ndinyom Jerusalem, Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi, Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma-ọli, Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.
6
Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku, Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense, Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?
7
Le, ọ bu ihe-ndina-ya, bú nke Solomon nwere; Ọgu ndi-dike atọ di ya buruburu, Site na ndi-dike nke Israel.
8
Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha: Onye ọ bula, mma-agha-ya di n'úkwù-ya, N'ihi egwu n'abali.
9
Eze, bú Solomon, emeworo onwe-ya otù palanquin Site n'osisi Lebanon.
10
Ogidi-ya nile ka o jiri ọla-ọcha me, Ala-ya ka o jiri ọla-edo me, ebe-ọnọdu-ya ka o jiri ogho ododo me, Etiti-ya, eji ihu-n'anya me ka ọ buru pavement ọma, Site n'aka umu-ndinyom Jerusalem.
11
Puanu, umu-ndinyom Zaion, lekwasi Solomon, bú eze, anya, Ka o kpuru okpu-eze nke nne-ya kpubeworo ya n'ubọchi ọlulu-nwunye-ya, Na n'ubọchi ọṅù nke obi-ya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8