bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Song of Solomon 7
Song of Solomon 7
Igbo 2006
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 8 →
1
Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n'akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya! Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma, Ọlu aka onye-ǹkà.
2
Otubo-gi di ka ọkwa di buruburu, Ka manya-vine agwara agwa ghara ikọ nime ya: Afọ-gi di ka obo ọka wheat Nke eji urodi b͕a ya buruburu.
3
Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua Nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru.
4
Olu-gi di ka ulo-elu nke ọdú; Anya-gi abua di ka ọdọ-miri nke di nime Heshbon, n'akuku ọnu-uzọ-ama Bat-rabim; Imi-gi di ka ulo-elu Lebanon Nke chere Damaskọs iru.
5
Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel, Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo; Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.
6
Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku, Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile!
7
Ogologo-gi nka yiri nkwu, Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine.
8
M'siri, M'gārigo elu nkwu, M'gējide igu-ya aka: Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine, Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple;
9
Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma, Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ, Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.
10
Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, N'arum ka ọchichọ-ya di kwa.
11
Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia; Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà.
12
Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile; Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru, Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko: N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam.
13
Mandrake nile nēsì ísì utọ, Ọzọ, n'elu ọnu-uzọ-ayi nile ka nkpuru-osisi nile di oké ọnu-ahia di, nke-ọhu na nke-ochie, Nke m'kpakọbaworo gi, onye ihe-gi nātọm utọ.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8