bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Joshua 14
Joshua 14
Igbo 2006
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 15 →
1
Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta;
2
n'ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu.
3
N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha.
4
N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.
5
Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu.
6
Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea.
7
Ọgu arọ abua ka m'b͕ara mb͕e Moses, bú orù Jehova, si na Kedesh-banea zipum iledo ala nka; m'we weghachiri ya okwu dika o si di n'obim.
8
Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n'azu.
9
Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu.
10
Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m'di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n'ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta.
11
Rue ub͕u a m'di ike ta dika m'di n'ubọchi Moses zigaram: dika ikem si di mb͕e ahu, otú a ka ikem di kwa ub͕u a, ibu agha, na ipu apu, na ibata abata.
12
Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.
13
Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa.
14
N'ihi nka Hebron we ghọrọ Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, ihe-nketa, rue ta; n'ihi na o sozuru Jehova, bú Chineke Israel, n'azu.
15
Ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba; onye dikarisiri uku n'etiti ndi Anak ka Aba ahu bu. Ala ahụ we rapu ibu agha, di jū.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
Recommended Reading
Commentary
Joshua Commentaries
→
Devotional
Joshua Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→