bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Joshua 15
Joshua 15
Igbo 2006
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 16 →
1
Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.
2
Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:
3
o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:
4
o we gabiga rue Azmon, pua na miri-iyi Ijipt; ọpupu ókè-ala ahu we di n'oké osimiri: nka gāburu unu ókè-ala Ndida.
5
Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n'ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan:
6
ókè-ala ahu we rigo rue Bet-họgla, gabiga n'akuku Ugwu nke Bet-araba; ókè-ala ahu we rigo rue nkume Bohan nwa Reuben:
7
ókè-ala ahu we rigo rue Debia site na ndagwurugwu Ekoa, ga n'akuku Ugwu, nēche Gilgal iru, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim, nke di n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: ókè-ala ahu we gabiga rue miri En-shemesh, ọpupu-ya we dirue En-rogel:
8
ókè-ala ahu we rigo na ndagwurugwu nwa Hinom rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida (ndida ahu bu Jerusalem): ókè-ala ahu we rigo rue elu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu Hinom n'akuku Ọdida-anyanwu, nke di na nsọtu ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu:
9
ewe kpa ókè-ala ahu site n'elu ugwu rue isi-iyi miri Neftoa, ọ we pua rue obodo nile nke ugwu Efron; ewe kpa ókè-ala ahu rue Beala (nke ahu bu Kiriat-jearim):
10
ókè-ala ahu we b͕a buruburu site na Beala ga n'akuku Ọdida-anyanwu, rue ugwu Sia, we gabiga rue akuku ugwu Jearim n'Ugwu (nke ahu bu Kesalon), rida rue Bet-shemesh, gabiga Timna:
11
ókè-ala ahu we pua rue akuku Ekron n'akuku Ugwu: ewe kpa ókè-ala ahu rue Shikeron, o we gabiga rue ugwu Beala, we pua na Jabneel; ọpupu ókè-ala ahu di n'oké osimiri.
12
Ókè-ala Ọdida-anyanwu we di rue oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya. Nka bu ókè-ala umu Juda buruburu, dika ab͕uru nile ha si di.
13
Ọ nye-kwa-ra Keleb Jefune òkè n'etiti umu Juda, dika okwu-ọnu Jehova gwara Joshua si di, bú Kiriat-aba; Aba bu nna Anak (nke ahu bu Hebron).
14
Keleb we si n'ebe ahu napu umu-ndikom Anak atọ, bú Sheshai, na Ahiman, na Talmai, umu Anak, ala-ha.
15
Ọ we si n'ebe ahu rigo imegide ndi bi na Debia: ma aha Debia na mb͕e gara aga bu Kiriat-sefa.
16
Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.
17
Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.
18
O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?
19
Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.
20
Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.
21
Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n'akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua;
22
na Kina, na Dimona, na Adada;
23
na Kedesh, na Hezoa, na Itnan;
24
na Zif, na Telem, na Bealot;
25
na Hezoa-hadata, na Keriot-hezron (nke ahu bu Hezoa);
26
na Amam, na Shema, na Molada;
27
na Haza-gada, na Heshmon, na Bet-pelet;
28
na Haza-shual, na Bia-sheba, na Biziotia;
29
na Beala, na Iyim, na Ezem;
30
na Eltolad, na Kesil, na Họma;
31
na Ziklag, na Madmana, na Sansana;
32
na Lebaot, na Shilhim, na Ain, na Rimon: obodo nile di orú na iteghete, ha na obodo ntà ha.
33
N'ebe di ala ala, Eshtaol, na Zọra, na Ashna;
34
na Zanoa, na En-ganim, na Tapua, na Inam;
35
na Jamut, na Adulam, na Soko, na Azeba;
36
na Shaaraim, na Aditaim, na Gedira, na Gedirotaim; obodo iri na anọ na obodo ntà ha.
37
Zenan, na Hadasha, na Migdal-gad;
38
na Dilan, na Mizpe, na Jọkteel;
39
na Lekish, na Bọzkat, na Eglon;
40
na Kabon, na Lahmam, na Kitlish;
41
na Gedirot, na Bet-degon, na Neama, na Makeda; obodo iri na isi na obodo ntà ha.
42
Libna, na Eta, na Ashan;
43
na Ifta, na Ashna, na Nezib;
44
na Keila, na Akzib, na Marisha; obodo iteghete na obodo ntà ha.
45
Ekron, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile:
46
site n'Ekron we rue oké osimiri, obodo nile nke di n'akuku Ashdod, na obodo ntà ha.
47
Ashdod, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; Geza, na umu-obodo-ya na obodo ntà ya nile; rue miri-iyi Ijipt, na oké osimiri uku ahu, na ókè-ala-ya.
48
N'ugwu kwa, Shamia, na Jatia, na Soko;
49
na Dana, na Kiriat-sana (nke ahu bu Debia);
50
na Anab, na Eshtemo, na Anim;
51
na Goshen, na Holon, na Gailo; obodo iri na otù na obodo ntà ha.
52
Arab, na Duma, na Eshan;
53
na Janim, na Bet-tapua, na Afika;
54
na Humta, na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), na Zioa; obodo iteghete na obodo ntà ha.
55
Maon, na Kamel, na Zif, na Juta;
56
na Jesreel; na Jokdeam, na Zanoa;
57
na Kain, na Gibea, na Timna; obodo iri na obodo ntà ha.
58
Halhul, na Bet-zua, na Gedoa;
59
na Maarat, na Bet-anot, na Eltekon; obodo isi na obdo ntà ha.
60
Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), na Raba; obodo abua na obodo ntà ha.
61
N'ọzara, Bet-araba, na Midin, na Sekaka;
62
na Nibshan, na Obodo Nnú, na En-gedi; obodo isi na obodo ntà ha.
63
Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24