bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Joshua 19
Joshua 19
Igbo 2006
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 20 →
1
Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n'etiti ihe-nketa umu Juda.
2
Ha we nwe n'ihe-nketa-ha Bia-sheba, ma-ọbu Sheba, na Molada;
3
na Haza-shual, na Bala, na Ezem;
4
na Eltolad, na Betul, na Họma;
5
na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa;
6
na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha:
7
na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha:
8
na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di.
9
Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha.
10
Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid:
11
ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam;
12
o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia;
13
o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea;
14
ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el;
15
na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha.
16
Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
17
Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di.
18
Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem;
19
na Hafaraim, na Shion, na Anaharat;
20
na Rabit, na Kishion, na Ebez;
21
na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez:
22
ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha.
23
Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha.
24
Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di.
25
Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf;
26
na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat;
27
ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe,
28
na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba;
29
ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib:
30
na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha.
31
Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
32
Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di.
33
Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan:
34
ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu.
35
Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret;
36
na Adama, na Rema, na Hezoa;
37
na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa;
38
na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha.
39
Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.
40
Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.
41
Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;
42
na Shaalabin na Ajalon, na Itla;
43
na Ilon, na Timna, na Ekron;
44
na Elteke, na Gibeton, na Bealat;
45
na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon;
46
na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo.
47
Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di.
48
Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
49
Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n'etiti ha:
50
n'okwu-ọnu Jehova ka ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ, bú Timnat-sera n'ugwu Efraim: o wue obodo ahu, biri nime ya.
51
Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 20 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
Recommended Reading
Commentary
Joshua Commentaries
→
Devotional
Joshua Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→