bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Joshua 17
Joshua 17
Igbo 2006
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 18 →
1
Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.
2
Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di.
3
Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.
4
Ha we biarue nso n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru Joshua nwa Nun, na n'iru ndi-isi, si, Jehova nyere Moses iwu inye ayi ihe-nketa n'etiti umu-nne-ayi: o we nye ha ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha dika okwu-ọnu Jehova si di.
5
Òkè iri we dabara Manase, nāgughi ala Gilead na Beshan, nke di n'ofè Jọdan;
6
n'ihi na umu-ndinyom Manase ketara ihe-nketa n'etiti umu-ya ndikom: ala Gilead kwa, umu-ndikom Manase fọduru nwere ya.
7
Ókè-ala Manase we si n'Asha rue Mikmetat, nke di n'iru Shekem; ókè-ala ahu we je rue aka-nri, rue ndi bi n'En-tapua.
8
Manase nwe ala Tapua: ma umu Efraim nwe Tapua rue ókè-ala Manase.
9
Ókè-ala ahu we rida rue miri-iyi Kena, n'akuku Ndida nke miri-iyi ahu: obodo ndia ka Efraim nwere n'etiti obodo Manase: ókè-ala Manase we di n'akuku Ugwu miri-iyi ahu, ọpupu-ya we di n'oké osimiri:
10
n'akuku Ndida ọ diri Efraim, ma n'akuku Ugwu ọ diri Manase, oké osimiri bu kwa ókè-ala-ya; ha we metu Asha n'Ugwu, metu kwa Isaka n'ọwuwa-anyanwu.
11
Manase nwekwara obodo n'Isaka na n'Asha, bú Bet-shean na umu-obodo-ya, na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na En-doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, bú ebe di elu atọ ahu.
12
Ma umu Manase apughi inapu ndi bi n'obodo ahu ala-ha; ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu.
13
O rue, mb͕e umu Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.
14
Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n'ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n'ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a?
15
Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n'onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n'ebe ahu n'ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa.
16
Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n'aka ndi Kenean nile ndi bi n'ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel.
17
Joshua we gwa ulo Josef, bú Efraim na Manase, okwu, si, Ndi bara uba ka i bu, ọ bu kwa ike uku ka i nwere: i gaghi-enwe nání otù ihe-ife-nzà:
18
n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
Recommended Reading
Commentary
Joshua Commentaries
→
Devotional
Joshua Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→