bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Joshua 21
Joshua 21
Igbo 2006
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 22 →
1
Ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai we biarue nso Eleeza, bú onye-nchu-àjà, biaru kwa nso Joshua nwa Nun, biaru kwa nso ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel;
2
ha we gwa ha okwu nime Shailo n'ala Kenean, si, Jehova nyere iwu n'aka Moses inye ayi obodo ufọdu ayi gēbi, ha na ebe-ita-nri-ha nke gādiri anu-ulo-ayi.
3
Umu Israel we si n'ihe-nketa-ha nye ndi Livai, dika okwu-ọnu Jehova si di, obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.
4
Ife-nzà we putara ab͕uru nile nke ndi Kohat: umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ndi sitere na ndi Livai, we nwe obodo iri na atọ sitere n'ebo Juda, site kwa n'ebo ndi Simeon, site kwa n'ebo Benjamin, n'ife-nzà.
5
Umu Kohat fọduru we nwe obodo iri sitere n'ab͕uru nile nke ebo Efraim, site kwa n'ebo Dan, site kwa na nkera ebo Manase, n'ife-nzà.
6
Umu Giashon we nwe obodo iri na atọ sitere n'ab͕uru nile nke ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa na nkera ebo Manase nime Beshan, n'ife-nzà.
7
Umu Merari dika ab͕uru nile ha si di we nwe obodo iri na abua sitere n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun.
8
Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha n'ife-nzà, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses.
9
Ha we si n'ebo umu Juda, si kwa n'ebo umu Simeon, nye obodo ndia nke akpọrọ ha n'aha n'ebe a:
10
ha we diri umu Eron, ndi sitere n'ab͕uru ndi Kohat, ndi sitere n'umu Livai: n'ihi na ha ka ife-nzà mbu diri.
11
Ha we nye ha Kiriat-aba, nna Anak ka Aba ahu bu, (nke ahu bu Hebron,) n'ugwu Juda, ya na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya.
12
Ma ọhia nke obodo ahu, na obodo ntà ya nile, ka ha nyere Keleb nwa Jefune n'ihe-onwunwe-ya.
13
Umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha nyere Hebron na ebe-ita-nri-ya, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Libna na ebe-ita-nri-ya nile;
14
na Jatia na ebe-ita-nri-ya nile, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile,
15
na Holon na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;
16
na Ain na ebe-ita-nri-ya nile, na Juta na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile; obodo iteghete site n'ebo abua ahu.
17
Site kwa n'ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile;
18
na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile, na Almon na ebe-ita-nri-ya nile: obodo anọ.
19
Obodo nile nke umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.
20
Ab͕uru nile nke umu Kohat, bú ndi Livai, bú ndi fọduru site n'umu Kohat, ha nwere obodo ife-nzà-ha site n'ebo Efraim.
21
Ha we nye ha Shekem na ebe-ita-nri-ya nile n'ugwu Efraim, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Gezea na ebe-ita-nri-ya nile;
22
na Kibzaim na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-horon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
23
Site kwa n'ebo Dan, Elteke na ebe-ita-nri-ya nile, na Gibeton na ebe-ita-nri-ya nile;
24
na Ajalon na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
25
Site kwa na nkera ebo Manase, Tanak na ebe-ita-nri-ya nile, na Gat-rimon na ebe-ita-nri-ya nile; obodo abua.
26
Obodo nile di iri, ha na ebe-ita-nri-ha, bú nke diri ab͕uru umu Kohat fọduru.
27
Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n'ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua.
28
Site kwa n'ebo Isaka, Kishion na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;
29
na Jamut na ebe-ita-nri-ya nile, na En-ganim na ebe-ita-nri-ya nile, obodo anọ.
30
Site kwa n'ebo Asha, Mishal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;
31
na Helkat na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
32
Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ.
33
Obodo nile nke ndi Giashon, dika ab͕uru nile ha si di, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.
34
Ha nye-kwa-ra ab͕uru nile nke umu Merari, bú Livai fọduru, Jokneam na ebe-ita-nri-ya nile; na Kata na ebe-ita-nri ya nile,
35
na Dimna na ebe-ita-nri-ya nile, na Nahalal na ebe-ita-nri-ya nile, sitere n'ebo Zebulun; obodo anọ.
36
Site kwa n'ebo Reuben, Beza na ebe-ita-nri-ya nile, na Jehaz na ebe-ita-nri-ya nile,
37
na Kedimot na ebe-ita-nri-ya nile, na Mefaat na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
38
Site n'ebo Gad, Remot nime Gilead na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Mahanaim na ebe-ita-nri-ya nile;
39
na Heshbon na ebe-ita-nri-ya nile, na Jeza na ebe-ita-nri-ya nile; obodo ahu nile di anọ.
40
Obodo ahu nile diri umu Merari dika ab͕uru nile ha si di, bú ndi fọduru site n'ab͕uru nile nke ndi Livai; ihe-ife-nzà-ha we di obodo iri na abua.
41
Obodo nile nke ndi Livai n'etiti ihe-onwunwe umu Israel di ọgu obodo abua na asatọ na ebe-ita-nri-ha.
42
Obodo ndia di otú a, obodo ọ bula na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya: otú a ka ọ diri obodo ndia nile.
43
Jehova we nye Israel ala ahu nile nke Ọ ṅuru iyi inye ndi bu nna-ha; ha we nweta ya, we biri nime ya.
44
Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha.
45
Ọ dighi ihe ọ bula dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova gwara ulo Israel; ha nile mere.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
Recommended Reading
Commentary
Joshua Commentaries
→
Devotional
Joshua Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→