bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Matthew 17
Matthew 17
Igbo 2006
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 18 →
1
Mb͕e ubọchi isi gasiri Jisus chiri Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne-ya, tiyere Onwe-ya, O kuru ha rigo n'ugwu di elu we pua iche:
2
O we nwogha n'iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè.
3
Ma le, eme ka ha hu Moses na Elaija ka ha na Ya nēkwurita okwu.
4
Pita we za, si Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ọ buru na I nāchọ, m'gāma ulo-ikwū atọ n'ebe a; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.
5
Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.
6
Mb͕e ndi nēso uzọ-Ya nuru ya, ha we da kpuchie iru-ha n'ala, tu kwa egwu ri nne.
7
Jisus we biakute ha, metu ha aka, si, Bilienu, unu atu-kwa-la egwu.
8
Ma mb͕e ha weliri anya-ha elu, ha ahughi onye ọ bula, ma-ọbughi nání Jisus.
9
Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, Jisus we nye ha iwu, si, Unu agwala onye ọ bula ihe unu huru, rue mb͕e Nwa nke madu gēsi na ndi nwuru anwu bilie.
10
Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Gini mere ndi-ode-akwukwọ ji si kwa na Elaija aghaghi ibu uzọ bia?
11
O we za, si, Ọ bu ezie na Elaija nābia, Ọ gēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu:
12
ma asim unu, na Elaija abiawori ub͕u a, ha amazughi kwa ya, kama ha mere n'aru-ya ka ihe ha chọrọ ra. Ọbuná otú a ka ha gaje ime kwa ka Nwa nke madu hu ahuhu.
13
Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya ghọtara na Ọ gwara ha okwu bayere Jọn Baptist.
14
Mb͕e ha biakutere ìgwè madu ahu, otù nwoke we biakute Ya, nēb͕uru Ya ikperè, nāsi kwa,
15
Onye-nwe-ayi, mere nwam nwoke ebere: n'ihi na ọ bu onye ọnwa nēme ka anya ghara idi ya nma, ọ nāhu kwa ahuhu nke-uku: n'ihi na ọtutu mb͕e ọ nādabà n'ọku, ọtutu mb͕e ọ nādabà kwa na miri.
16
M'we kuru ya biakute ndi nēso uzọ-Gi, ma ha apughi ime ka aru-ya di ike.
17
Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya n'ebe a.
18
Jisus we bara ya nba; mọ ọjọ ahu we si nime ya puta: ewe me ka aru nwa-okoro ahu di ike site n'oge hour ahu.
19
Mb͕e ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus iche, si, N'ìhi gini ka ayi onwe-ayi nāpughi ichupu ya?
20
O we si ha, N'ihi okwukwe ntà unu: n'ihi na n'ezie asim unu, Ọ buru na unu nwere okwukwe dika nkpuru mustard, unu gāsi ugwu a, Si n'ebe a gabiga n'ebe ahu; ọ gāgabiga kwa; ihe ọ bula agaghi-adi kwa nke unu nāpughi ime.
21
Ma otú ọ di mọ di otú a apughi iputa ma-ọbughi site n'ekpere na ibu-ọnu.
22
Ma mb͕e ha bi na Galili, Jisus siri ha, Agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu;
23
ha gēb͕u kwa Ya, ewe me ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ. O we wuta ha ri nne.
24
Ma mb͕e ha biara na Kapanaum, ndi nānara ego ùtú biakutere Pita, si, Ònye-ozizí-unu adighi-atu ego ùtú?
25
Ọ si, E. Mb͕e ọ batara n'ulo, Jisus we buru uzọ gwa ya okwu, si, Gini bu uche-gi, Saimon? ndi-eze uwa, sìte n'aka ole ndi ka ha nānara ùtú-ahia ma-ọbu ùtú n'isi madu? n'àka umu-ha, ma-ọbu n'aka ndi-ọbìa?
26
Ma mb͕e ọ siri, N'aka ndi-ọbìa, Jisus si ya, Ya mere umu-ha puru nime ya.
27
Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28