bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Matthew 26
Matthew 26
Igbo 2006
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 27 →
1
O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia nile, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,
2
Unu matara na mb͕e ubọchi abua gasiri ememe ngabiga nābia, arara kwa Nwa nke madu nye ka akpọgide Ya n'obe.
3
Mb͕e ahu ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ n'obí onye-isi-nchu-àjà, onye anākpọ Kaiafas;
4
ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya.
5
Ma ha siri, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù we ghara iputa n'etiti ndi-Ju.
6
Ma mb͕e Jisus nọ na Betani, n'ulo Saimon onye-ekpenta,
7
otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n'isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri.
8
Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, iwe were ha nke-uku, ha si, Èji ila-n'iyì nka me gini?
9
N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye.
10
Ma mb͕e Jisus mara ya, Ọ si ha, Gini mere unu nēsob͕u nwanyi a? n'ihi na ọ luru ọlu ọma n'arum.
11
N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.
12
N'ihi na n'iwusi manu-otite a n'arum, o mere ya ka o we doziem n'olìlì.
13
N'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.
14
Mb͕e ahu otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, onye anākpọ Judas Iskariot, jekuru ndi-isi-nchu-àjà,
15
si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n'aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya.
16
Site na mb͕e ahu o we chọ oghere irara Ya nye.
17
Ma n'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Òle ebe I nāchọ ka ayi doziere Gi ka I we rie oriri ngabiga?
18
O we si, Jenu n'obodo a jekuru onye di otú a, si ya, Onye-ozizí si, Ogem di nso; Mu na ndi nēso uzọm nēme ememe ngabiga n'ulo-gi.
19
Ndi nēso uzọ-Ya we me dika Jisus nyere ha iwu; ha we dozie ememe ngabiga.
20
Ma mb͕e o ruru anyasi, Ya na ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya nọduru na nri;
21
mb͕e ha nēri ihe, Ọ si, N'ezie asim unu, na otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye.
22
O we wuta ha ri nne, ha nile n'otù n'otù we malite isi Ya, Ọ̀ bu mu, Onye-nwe-ayi?
23
Ma Ọ zara, si, Onye nke Mu na ya sukọrọ aka n'afere, onye ahu gāraram nye.
24
Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.
25
Judas, onye nārara ya nye, we za, si, Ọ̀ bu mu, Rabai? Ọ si ya, Gi onwe-gi kwuru.
26
Mb͕e ha nēri ihe, Jisus we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya; O we nye ndi nēso uzọ-Ya, si, Naranu, rie; nka bu arum.
27
O we nara iko, kele kwa, we nye ha, si, Unu nile ṅua nime ya;
28
n'ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie.
29
Ma asim unu, M'gaghi-aṅu ma-ọli site n'ub͕u a n'ihe a si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n'ala-eze Nnam.
30
Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.
31
Mb͕e ahu Jisus si ha, Agēme ka unu onwe-unu nile ma n'ọnyà n'arum abali ta: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu nke ìgwè aturu-ya.
32
Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili.
33
Ma Pita zara, si Ya, Ọ buru na agēme madu nile ka ha ma n'ọnyà n'aru Gi, agaghi-eme ka mu onwem ma n'ọnyà mb͕e ọ bula.
34
Jisus si ya, N'ezie asim i, na n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá, i gāgọnarim ub͕ò atọ.
35
Pita si Ya, Ọ buru na ọ di nkpà ọbuná ka m'so Gi nwua, agaghm-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ndi ahu nile ndi nēso uzọ-Ya kwuru.
36
Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'gēje n'ebe ahu kpe ekpere.
37
O we kuru Pita na umu Zebedi abua tiyere Onwe-ya, o we malite iwuta Ya n'obi, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri.
38
Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, som nēche nche.
39
O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.
40
O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Ùnu di otú a nēnweghi ike isom che nche otù oge hour?
41
Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike.
42
O we rapu ha je kwa ọzọ nke ub͕ò abua, kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na nka apughi igabiga, ma ọ buru na aṅughm ya, ka eme ihe I nāchọ.
43
O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di arọ́.
44
O we rapu ha ọzọ, je, kpe ekpere nke ub͕ò atọ, nēkwu otù okwu ahu ọzọ.
45
Mb͕e ahu Ọ biakute ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: le, oge hour nkem di nso, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie.
46
Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso.
47
Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ.
48
Ma onye nārara Ya nye nyere ha ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya: jidenu Ya.
49
Ngwa ngwa ọ biakutere Jisus, si, Ekele, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku.
50
Jisus we si ya, Eyim, me ihe i biara ime. Mb͕e ahu ha biakutere Ya, we tukwasi Jisus aka, jide Ya.
51
Ma le, otù onye nime ndi ha na Jisus nọ setiri aka-ya, miputa mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-aja mma, bipu nti-ya.
52
Mb͕e ahu Jisus si ya, Mighachi mma-agha-gi n'ọnọdu-ya: n'ihi na madu nile ndi were mma-agha gāla n'iyì site na mma-agha.
53
Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi?
54
Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a?
55
N'oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M'nọduru n'ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm.
56
Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n'akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga.
57
Ma ndi jidere Jisus si n'ebe ahu duru Ya je rue ulo Kaiafas onye-isi-nchu-àjà, ebe ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye zukọrọ.
58
Ma Pita soro Ya n'ebe di anya, rue obí onye-isi-nchu-àjà, o we ba nime, nọdu n'etiti ndi nēje ozi, ka ọ hu ọgwugwu-ya.
59
Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà ugha imegide Jisus, ka ha we me ka Ọ nwua;
60
ma ha achọtaghi, ọ bu ezie na ọtutu ndi-àmà ugha biara. Ma emesia abua biara,
61
si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n'ubọchi atọ.
62
Onye-isi-nchu-àjà we bilie, si Ya, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi?
63
Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke.
64
Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n'ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe.
65
Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu:
66
gini bu uche-unu? Ha we za, si, O kwesiri inwu ọnwu.
67
Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n'iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe,
68
si, Buru ayi amuma, Kraist: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka?
69
Ma Pita nọduru n'èzí n'obí: otù nwa-ab͕ọghọ we biakute ya, si, Gi onwe-gi na Jisus Onye Galili nọ-kwa-ra.
70
Ma ọ gọrọ n'iru ha nile, si, Amataghm ihe i nēkwu.
71
Ma mb͕e ọ puru je n'uzọ-nbata, nwa-ab͕ọghọ ọzọ huru ya, ọ si ndi nọ n'ebe ahu, Nwoke a na Jisus Onye Nazaret nọ-kwa-ra.
72
O were iṅu-iyí gọ kwa ọzọ, si, Amataghm Nwoke a.
73
Ma mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso biakutere Pita, si ya, N'ezie gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha; n'ihi na okwu-ọnu-gi nēweputa gi n'ìhè.
74
Mb͕e ahu ọ malitere idu ikwù na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a. Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá.
75
Pita we cheta okwu Jisus kwururi, si, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku.
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 27 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28