bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Matthew 18
Matthew 18
Igbo 2006
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 19 →
1
N'oge hour ahu ndi nēso uzọ-Ya biakutere Jisus, si, Ònye kwa dikariri uku n'ala-eze elu-igwe?
2
O we kpọ otù nwatakiri biakute Ya, Ọ debe ya n'etiti ha,
3
si, N'ezie asim unu, Ọ buru na unu echigharighi, bia di ka umu-ntakiri, unu agaghi-abà n'ala-eze elu-igwe ma-ọli.
4
Ya mere, onye ọ bula nke gēweda onwe-ya dika nwatakiri a, onye ahu dikariri uku n'ala-eze elu-igwe.
5
Ọzọ, onye ọ bula nke gānara otù nwatakiri di otú a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma:
6
ma onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwere na Mu ka ọ ma n'ọnyà, ihe gābara ya urù bu ka ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, ka o mìkpu kwa n'ob͕u oké osimiri.
7
Ahuhu gādiri uwa site n'ihe di iche iche nēme ka madu ma n'ọnyà; n'ihi na ọ di nkpà na ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà gābia; ma ahuhu gādiri madu ahu onye ihe ahu nēme ka madu ma n'ọnyà nēsite n'aka-ya bia.
8
Ma ọ buru na aka-gi ma-ọbu ukwu-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu n'ọlusi ma-ọbu na ngwurọ, kari inwe aka abua ma-ọbu ukwu abua atubà i n'ọku ebighi-ebi.
9
Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, wepu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: ọ di gi nma ibà na ndu nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ.
10
Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.
11
N'ihi na Nwa nke madu biara izọputa ndi nile furu efu.
12
Gini bu uche-unu? ọ buru na onye ọ bula nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha hie uzọ, ọ̀ dighi-agha ọgu anọ na iri na iteghete ahu, ga ugwu, nāchọ nke ahu hiere uzọ?
13
Ma ọ buru na o nwere ka o si chọta ya, n'ezie asim unu, ọ nāṅuri n'isi ya kari n'isi ọgu anọ na iri na iteghete ahu nēhieghi uzọ.
14
Otú a ọ bughi ihe achọrọ n'iru Nna-unu Nke bi n'elu-igwe, ka otù nime ndi ntà ndia la n'iyì.
15
Ọzọ, ọ buru na nwa-nna-gi emehie megide gi, je, tua ya nmehie-ya n'anya n'etiti nání gi na ya abua: ọ buru na ọ nuru olu-gi, i ritara nwa-nna-gi n'urù.
16
Ma ọ buru na ọ nughi, kuru otù madu ma-ọbu madu abua ọzọ tiyere onwe-gi, ka ewe me okwu ọ bula ekwuru ka o guzo n'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ.
17
Ma ọ buru na ọ ṅaghi ha nti, gwa nzukọm: ma ọ buru na ọ ṅaghi kwa nzukọm nti, ka ọ diri gi ka onye mba ozọ na onye-ọna-utu.
18
N'ezie asim unu, Ka ha ra, bú ihe unu gēke ab͕u n'elu uwa, agēke ha n'elu-igwe: ka ha ra kwa, bú ihe unu gātọpu n'elu uwa, agātọpu ha n'elu-igwe.
19
Ọzọ, asim unu, na ọ buru na madu abua n'etiti unu gēnwe otù olu n'elu uwa bayere ihe ọ bula ha gāriọ, agēme ya nye ha site na Nnam Nke bi n'elu-igwe.
20
N'ihi na ebe madu abua ma-ọbu atọ zukọworo n'aham, n'ebe ahu ka M'nọ n'etiti ha.
21
Mb͕e ahu Pita biakutere Ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, ùb͕ò ole ka nwa-nnam gēmehie megidem, ewem b͕aghara ya? rùe ub͕ò asa?
22
Jisus si ya, Asighm i, Rue ub͕ò asa; kama, Rue ọgu ub͕ò atọ na iri uzọ asa.
23
N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie.
24
Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise.
25
Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.
26
Ya mere orù ahu dara n'ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi ihe nile.
27
Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n'aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri.
28
Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji.
29
Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi.
30
Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji.
31
Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n'obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere.
32
Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n'ihi na i riọrọm:
33
ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere?
34
Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n'aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji.
35
Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n'obi-unu.
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 19 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28