bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Matthew 20
Matthew 20
Igbo 2006
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 21 →
1
N'ihi na ala-eze elu-igwe yiri nwoke nke bu nna-nwe-ulo, onye puru n'isi-ututu igota ndi-ọlu ije n'ubi-vine-ya.
2
Ma mb͕e ya na ndi-ọlu ahu nwere otù olu ka o nye ha otù shilling kwa-ubọchi, o zigara ha n'ubi-vine ya.
3
Ọ we pua dika oge hour nke-atọ, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo n'ọma-ahia nālughi ọlu;
4
o we si ndi ahu, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem, ihe ọ bula ziri ezi ka m'gēnye unu. Ha we je.
5
Ọ we pu kwa ọzọ dika oge hour nke-isi na nke-iteghete, me kwa otú ahu.
6
Ọ we pua dika oge hour nke-iri-na-otù, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo; ọ si ha, Gini mere unu guzoro n'ebe a ubọchi dum nālughi ọlu?
7
Ha si ya, N'ihi na ọ dighi onye ọ bula goro ayi ilu ọlu. Ọ si ha, Unu onwe-unu ga kwa n'ubi-vine nkem.
8
Ma mb͕e o ruru anyasi, onye-nwe ubi-vine ahu si onye o tiyere ihe-ya n'aka, Kpọ ndi-ọlu ahu, kwua ha ugwọ-ọlu-ha, malite site na ndi-ikpe-azu rue ndi bu uzọ.
9
Mb͕e ndi egoro n'oge hour nke-iri-na-otù biara, ha we nata otù onye otù shilling.
10
Ma mb͕e ndi bu uzọ biara, ha chère na ha gānata nke ka; ma ha onwe-ha nata-kwa-ra otù onye otù shilling.
11
Ma mb͕e ha natara ya, ha tamube megide nna-nwe-ulo ahu,
12
si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku.
13
Ma ọ zara otù onye nime ha, si, Eyìm, emejọghm i: mù na gi enweghi otù olu ka m'nye gi otù shilling?
14
Welie nke bu nke gi, la; anamachọ ka m'nye onye-ikpe-azu a dika m'nye-kwa-ra gi.
15
Ò zighi ezi n'iwu ka m'were ihe nile nkem me ihe m'nāchọ? ma-ọbu ànya-gi jọrọ njọ, n'ihi na mu onwem bu ezi madu?
16
Otú a ndi-ikpe-azu gēbu uzọ, ndi bu uzọ gābu kwa ndi-ikpe-azu.
17
Mb͕e Jisus nārigoro Jerusalem, O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu iche, bú ndi nēso uzọ-Ya, tiyere Onwe-ya, O we si ha n'uzọ,
18
Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpé ọnwu,
19
rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ ka ha me Ya ihe-ọchì, pia Ya ihe, kpọgide Ya n'obe: agēme kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.
20
Mb͕e ahu nne umu Zebedi biakutere Ya, ya na umu-ya ndikom, nākpọ isi ala nye Ya, nāriọ kwa Ya ihe n'aka.
21
O we si ya, Gini ka i nāchọ? Ọ si Ya, Kwue ka umum ndikom abua ndia nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe-Gi, n'ala-eze-Gi.
22
Ma Jisus zara, si, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem gaje iṅu? Ha si Ya, Ayi puru.
23
Ọ si ha, Ikom ka unu gāṅu n'ezie: ma inọdu n'aka-nrim, na n'aka-ekpem, abughi nkem inye, kama ọ diri ndi Nnam doziworo ya.
24
Ma mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya, iwe were ha nke-uku n'ihi umu-nne abua ahu.
25
Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Unu amatawo na ndi bu isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha: ndi uku ha nāchi kwa ha.
26
Ọ bughi otú a ka ọ gādi n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi;
27
ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gābu orù-unu:
28
dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.
29
Mb͕e ha nāputa na Jeriko, oké ìgwè madu we so Ya.
30
Ma le, ndi-ìsì abua ndi nānọdu n'akuku uzọ, mb͕e ha nuru na Jisus nāgabiga, ha tie nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.
31
Ìgwè madu ahu we bara ha nba, ka ha kpuchie ọnu-ha: ma ha tikariri nkpu, si, Onye-nwe-ayi, mere ayi ebere, Nwa Devid.
32
Jisus we guzo, kpọ ha, we si, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?
33
Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, ka ewe meghe anya-ayi.
34
Ma Jisus, ebe O nwere ọmiko n'aru-ha, O we metu anya-ha aka: ngwa ngwa ewe me ka ha hu uzọ, ha we so Ya.
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28