bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Matthew 6
Matthew 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 7 →
1
Lezienu anya ka unu ghara ime ezi omume-unu n'iru madu, ka ha we kiri unu: ma unu emeghi otú a unu enweghi ugwọ-ọlu n'ebe Nna-unu Nke bi n'elu-igwe nọ.
2
Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n'iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n'ulo-nzukọ-unu na n'uzọ-unu, ka ha we nara otuto n'aka madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.
3
Ma mb͕e i nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme:
4
ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.
5
Mb͕e ọ bula unu nēkpe kwa ekpere, unu agaghi-adi ka ndi-iru-abua ahu: n'ihi na ọ nātọ ha utọ iguzo n'ulo-nzukọ-unu na nkuku amá-unu ikpe ekpere, ka ha we were onwe-ha gosi madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.
6
Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi.
7
Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu.
8
Ya mere, unu eyila ha: n'ihi na Nna-unu matara ihe nile di unu nkpà, mb͕e unu akāriọghi Ya.
9
Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ.
10
Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa.
11
Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta.
12
B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.
13
Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.
14
N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu.
15
Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.
16
Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.
17
Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi;
18
ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi.
19
Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori:
20
kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori:
21
n'ihi na ebe àkù-gi di, n'ebe ahu ka obi-gi gādi kwa.
22
Oriọna nke aru bu anya: ya mere ọ buru na anya-gi ele otù ebe, aru-gi dum gējuputa n'ìhè.
23
Ma ọ buru na anya-gi jọrọ njọ, aru-gi dum gējuputa n'ọchichiri. Ya mere, ọ buru na ìhè nke di nime gi bu ọchichiri, le ka ọchichiri ahu si di oké ibù!
24
Ọ dighi onye ọ bula puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anya; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.
25
N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?
26
Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?
27
Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya?
28
Gini mere unu nēcheb͕u kwa onwe-unu nye uwe-oyiyi? Ribanu urodi nke ubi ámá, otú ha nētó etó; ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho:
29
ma asim unu, na ọbuná Solomon n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia.
30
Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà?
31
Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi?
32
N'ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n'ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà.
33
Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.
34
Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu nye echi: n'ihi na echi gēcheb͕uru onwe-ya. Ihe ọjọ nke ubọchi ta ezuworo ya.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28