bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Numbers 10
Numbers 10
Igbo 2006
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 11 →
1
Jehova we gwa Moses okwu, si,
2
Mere onwe-gi opì ọla ọcha abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha: ha gābu-kwa-ra gi ihe bayere nkpọkọta nzukọ Israel, na ihe bayere nbuli-ije nke omuma-ulo-ikwū nile ha.
3
Mb͕e ha gēwere ha fùa, nzukọ Israel nile gēzukọ n'ebe i nọ rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.
4
Ma ọ buru na otù ka ha were fùa, ndi-isi, bú ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, gēzukọ kwa n'ebe i nọ.
5
Mb͕e unu gāfù opì ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Iru-anyanwu gēbuli kwa ije.
6
Mb͕e unu gāfù opì ub͕ò nke-abua ka ọ we dasie uda ike, ọmuma-ulo-ikwū nile nke nāma ulo-ikwū-ha n'akuku Ndida gēbuli kwa ije: ha gāfù opì ka ọ we dasie uda ike bayere nbuli-ije nile ha.
7
Ma n'ikpọkọta nkpọkọta Israel unu gāfù opì, ma unu emela ka ọ dasie uda ike.
8
Ọ bu umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēwere opì abua ahu fua; ha gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu.
9
Ọzọ, mb͕e unu nēbu agha n'ala-unu megide onye-nkpab͕u nākpab͕u unu, unu gēwere opì me ka ha dasie uda ike; agēcheta kwa unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, agāzọputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu.
10
Ọ bu kwa n'ubọchi ọṅu-unu, na na mb͕e nile unu akara àkà, na nime nmalite ọnwa nile unu, ka unu gēwere opì abua ahu fùa n'elu àjà-nsure-ọku nile unu, na n'elu ihe àjà nke àjà-udo nile unu; ha gābu-kwa-ra unu ihe-ncheta n'iru Chineke-unu; Mu onwem bu Jehova, Chineke-unu.
11
O rue n'arọ nke-abua, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu, na igwe-oji ahu siri n'elu ebe-obibi nke ihe-àmà ahu rigo.
12
Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran.
13
Ma ha buru uzọ bulie ije n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.
14
Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Juda buru uzọ bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Nahshon nwa Aminadab nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
15
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Isaka bu Netanel nwa Zua.
16
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Zebulun bu Eliab nwa Hilon.
17
Ewe weda ebe-obibi ahu; umu Giashon na umu Merari, ndi nēbu ebe-obibi ahu, we bulie ije.
18
Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elizua nwa Shedeua nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
19
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Simeon bu Shelumiel nwa Zurishadai.
20
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Gad bu Eliasaf nwa Deuel.
21
Ndi Kohat we bulie ije, nēbu ebe nsọ ahu: ma ndi ọzọ guzoro ebe-obibi ahu ọtọ rue ọbibia-ha.
22
Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Efraim we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Elishama nwa Amihud nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
23
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Manase bu Gameliel nwa Pedahzua.
24
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Benjamin bu Abidan nwa Gideoni.
25
Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.
26
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Asha bu Pagiel nwa Ọkran.
27
Onye nọ n'isi usu-ndi-agha nke ebo umu Naftali bu Ahira nwa Inan.
28
Ndia bu nbuli-ije nke umu Israel, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; ha we bulie ije.
29
Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M'gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n'ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel.
30
Ọ we si ya, M'gaghi-eje; kama alam na umu-nnam ka m'gālakuru.
31
Ọ we si, Biko, arapula ayi; n'ihi na i mara ọmuma-ulo-ikwū-ayi n'ọzara, i gābu-kwa-ra ayi anya.
32
O gēru kwa, mb͕e i soro ayi je, o gēru kwa, na ezi ihe ahu nke Jehova gēme ayi nma ya, ayi gēme kwa gi nma.
33
Ha we si n'ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n'iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike
34
Igwe-oji nke Jehova we di n'elu ha n'ehihie, mb͕e ha si n'ọmuma-ulo-ikwū bulie ije.
35
O rue, nime nbuli-ije ib͕e ahu, na Moses nāsi, Bilie, Jehova, ka ndi-iro-Gi b͕asa; ka ndi nākpọ Gi asì b͕apu kwa n'iru Gi.
36
Ma mb͕e o zuru ike, ọ nāsi, Jehova, laghachikute ọtutu ìgwè madu ndia, bú usu nile nke nnù madu abua na ọgu iri nke Israel.
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36